Posts

Showing posts with the label Amaechi Okwuosa

N’Anambra, ndị Angịlịkan ekpeela ekpere pụrụ iche maka ọnọdọ nchekwa, nhọpụta gọvanọ

NNUKWU ọgbakọ ekpere pụrụ iche ewerela ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka (Ọka) bụ isi obodo steeti Anambra maka ọnọdụ ala Nigeria, ọnọdụ nchekwa, nà nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ a na-akwadobe ime na steeti Anambra n’abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a.   Ọgbakọ ekpere ahụ a kpọrọ ‘2021 Anambra State Anglican Prayer Rally’ bụ nke a chịkọbara site n’aka ndị ụka Angịlịkan n’ime steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara ndị òtù ụka Angịlịkan sitere dayọsis iteghete mejupụtara mpaghara Naịjà (Province of the Niger); ndị ọrụ gọọmenti, ndị ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị icheiche esonye n’ịzọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.   N’okwu ọ gwara ọhaneze sonyere n’ọgbakọ ekpere ahụ, Ashbishọọpụ mpaghara Niger ma bụrụkwa Bishọọpụ ụka Angịlịkan na Dayọsis Awka, bụ Ashbishọọpụ Alexander Chibuzor Ibezim kọwàrà na isiokwu mmemme ahụ, nke pụtara “Dị̀ Ike n’Ime Onyenweanyị” (ma a sụgharịa ya) bụ nke magburu onwe ya ma bụrụkwa nke dabàrà àdábà mà e lekwàsị anya na nsogbu dị icheiche na-adakwàsị