Posts

Showing posts with the label Amụma mmiri

Arụ: Amụma mmiri egbuola di, nwunye na ụmụ ha

 AMỤMA mmiri egbuola mmadụ anọ si n’otu ezinaụlọ. Njinji ahụ jiri na Agwaetiti (Lake Vitoria’s Bumbile Island) dị na mpaghara Mulebe nke dị na Kagera na mba Tanzania.   Kọmishọna nke Muleba aha ya bụ Thoba Nguvilla gwara ndị ntaakụkọ na amụma mmiri gburu ezinaụlọ ahụ ka ha na-arahụ ụra abalị. Ọ kọwara na ndị ahụ lara mmụọ bụ di, nwunye na ụmụ ha abụọ.   E kwuru na ezinaụlọ ahụ na-arụ ọrụ ugbo tinyere ịkụ ọkụ azụ n’Agwaetiti (Island) ahụ.   Robert Musiibha, onyeisi Bulyo, otu ogbe dị na mpaghara ahụ kwuru na ọkụ gbariri ụlọ ezinaụlọ ahụ bụ nke e ji gbamgbam kụọ, ka amụma mmiri ahụ wakporo ha.

Amụma mmiri egbuola ụmụaka iri na Uganda

AMỤMA mmiri egbuola ụmụaka iri na mpaghara ‘North-Western’Uganda n’obodo Arua, dịka ha gbabara n’otu obere ụlọ ka mmiri na-ezo.   Ụmụaka ahụ ka ekwuru na ha na-agba bọọl ma oge oke mmiri malitere zobe, ha gbabara n’otu ụlọakịrịka dị nso ebe ahụ ka ha zere mmiri, ma amụma segburu ha ebe ahụ.   Ụmụaka iteghete  dị n’agbata afọ iri na atọ ruo afọ iri na isenwụrụ ozugbo, ebe otu n’ime ha nwụrụ ka e bu ya aga ụlọọgwụ. Mmadụ atọ dị ndụna-anara ọgwụgwọ n’ụlọọgwụ.   Mpaghara mba Ugandaahụ na-ahụta oke mmiri ozizo tinyekwara egbe eluigwe na amụma mmiri.   Ọdachị ahụ bụ nkekacha njọ n’ụdị ya a hụtarala na mba Uganda kemgbe 2011, oge ụmụaka iri na asatọnwụrụ n’ụlọakwụkwọ.   N’otu afọ ahụ, amụmammiri gburu mmadụ iri abụọ na asatọ n’otu izuụka.   Na Febụwarị afọ a, ọzọdimgbaanọ bụ ụdị dị ụkọ na-ebi n’elu ugwu (rare mountain gorillas) nwụrụ dịka amụmammiri zutere ha ma gbuo ha.