Gọvanọ Obianọ enyefèéla amụmà ego ọrụ ahọ 2022 n'aka ndị omeiwu Anambra
AKA na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Willie Obianọ enyefèéla amụmà ego ọrụ ahọ na-abịa abịa, bụ ahọ 2022 n’aka ndị ụlọ omeiwu steeti ahụ maka inyòchà, ilebà ya anya na ime ihe ndị ọzọ e kwesiri ime iji nabàta ma bìnye aka na ya. Nke a bụ n’ịgbasò mkpebi ahụ Gọvanọ Obianọ mere na amụma ego ọrụ steeti ahụ ga na-aga n’usòrò ọnwa Jenụwarị ruo ọnwa Disemba, n’abụghị n’agbàtà etitì otu ahọ na ibè ya. Ya bụ amụmà ego ọrụ bụ nke dị otu narị ijeri naịra na iri anọ na otu, na ụma nde naịra iri iteghete na asaa (N141.97b); ma bụrụkwa nke pasenti iri isii na asaa n’ime ya bụ maka ọrụ mmepe, ebe pasenti iri atọ na atọ n’ime ya bụ maka ịkwụ ụgwọ na ihe ndị ọzọ a na-eme na mgbe na mgbe. N’amụmà ego ọrụ ahụ, ịrụ okporoụzọ na ọrụ mmepe ndị ọzọ ga-ewè ijeri naịra iri abụọ na atọ; ọrụ ụgbo ga-ewe ijeri naịra atọ, ebe a ga-etinye ijeri naịra atọ na ụma iri atọ na abụọ n’agụmakwụkwọ; tinye ijeri naịra atọ na ụma iri anọ na abụọ n’ihe gbasaara gburugburu; tinye ijeri naịra abụọ na narị puku naịra asatọ