Onye Nigeria eturula ugo ọka ibe na Mahadum US
NWAAGBỌGHỌ onye Nigeria gbara afọ iri abụọ, aha ya bụ Alaba Ann Tam Dangnogo eturula ugo dịka nwaakwụkwọ kacha ibe ya n’afọ 2021 na mahadum, Syracuse University, United State (US). Nwaagbọghọ ahụ nke ụbụrụ isi na-aghọ nkọ ji ogogo 3.97 ‘GPA’ were pụta na mahadum ahụ. Alaba, onye steeti Rivers, ji nzere kachanụ ‘distinctions’ n’ihe ọmụmụ Biology major na English minor na Textual Studies. Ọ bụ ya gụpụtara ozi (valedictorian) klaasị 2021 n’ihi na ọ bụ ya kachara me nke ọma, dịka a họpụtara ya ka ‘Senior Class Marshall’ nke mahadum ahụ. Ozi si Syracuse University kọwara na a hụtara U.G.C Danangogo ka ọ pụrụ iche na mmụta na mahadum ahụ dịka o ji ogogo dị elu were pụta. A nọkwa n’elu ya nye ya ohere agụmakwụkwọ n’efu (1890 scholarship) iji gụkwo akwụkwọ banyere ihe ọmụmụ ahụike (medical study), afọ anọ ọzọ. Mahadum ahụ toro ụbụrụ ịnụ ọkụ Danagogo. Ka ọ na-ekwu banyere mbọ ya, Onyeisi (Dean) ‘Arts and Science’ Ọkammụta Karin Ruhlandt kelere Danangogo maka ịbụ nwaakwụkwọ ụbụrụ ya na-a