Alụ: Ndị nkuzi na-akwasazị ụmụakwụkwọ ha iko
Chinwendu Uzoatu EGWU dịkwa! Ihe arụ na-emezi. Ọkwa ndị Igbo na-ekwu n’okwu sị na alụ gbaa afọ, ọ bụrụ omenala. Gini kpatara na nkịta na-atazi ọkpụkpụ a nyabara n’olu aghara aghara n’ụlọakwụkwọ anyị? Ma n’ụlọakwụkwọ nta ma nke ukwu, otu ihe ahụ na-ebe. Ndị nkuzi bụ ndị a hanyere ụmụakwụkwọ n’aka ka ha kụzie ma gbazikwaara ha. Mana ọ na-abụzi ihe iju anya ebe onye nkuzi n’atụgharịzị ghọrọ nwamba, chụba ụmụakwụkwọ ka oke. A kọọna ọtụtụ akụkọ banyere alụ dị iche iche na-eme n’ụlọakwụkwọ ugbua. N’izu ụka olemole gara aga ka a kọrọ ka ndị nkuzi mmadụ ise si tụba otu nwata akwụkwọ nke nọ na ‘senior’ sekọndịrị ogo nke atọ ime na steeti Kebbi. N’otu aka ahụkwa, na nwa mgbe gara aga ka a gbara n’anwụ otu e si chụọ otu ọkammụta n’ọlụ na mahadum ‘Obafemi Awolowo, Ile Ife, n’ihi nwanyị onye ọchọrọ idina ka o wee nye ya maaki n’ule akwụkwọ ha lere. N’oge gara aga, a kọrọ ka otu onye na-efe ala nna ya si dinaa nwata akwụkwọ na klaasi mgbe akwụkwọ gbasara. Nke a mere na steeti Anambra. Ka a na-ekwu