Posts

Showing posts with the label Alụ

Alụ: Ndị nkuzi na-akwasazị ụmụakwụkwọ ha iko

Chinwendu Uzoatu   EGWU dịkwa! Ihe arụ na-emezi. Ọkwa ndị Igbo na-ekwu n’okwu sị na alụ gbaa afọ, ọ bụrụ omenala. Gini kpatara na nkịta na-atazi ọkpụkpụ a nyabara n’olu aghara aghara n’ụlọakwụkwọ anyị? Ma n’ụlọakwụkwọ nta ma nke ukwu, otu ihe ahụ na-ebe. Ndị nkuzi bụ ndị a hanyere ụmụakwụkwọ n’aka ka ha kụzie ma gbazikwaara ha. Mana ọ na-abụzi ihe iju anya ebe onye nkuzi n’atụgharịzị ghọrọ nwamba, chụba ụmụakwụkwọ ka oke. A kọọna ọtụtụ akụkọ banyere alụ dị iche iche na-eme n’ụlọakwụkwọ ugbua. N’izu ụka olemole gara aga ka a kọrọ ka ndị nkuzi mmadụ ise si tụba otu nwata akwụkwọ nke nọ na ‘senior’ sekọndịrị ogo nke atọ ime na steeti Kebbi. N’otu aka ahụkwa, na nwa mgbe gara aga ka a gbara n’anwụ otu e si chụọ otu ọkammụta n’ọlụ na mahadum ‘Obafemi Awolowo, Ile Ife, n’ihi nwanyị onye ọchọrọ idina ka o wee nye ya maaki n’ule akwụkwọ ha lere. N’oge gara aga, a kọrọ ka otu onye na-efe ala nna ya si dinaa nwata akwụkwọ na klaasi mgbe akwụkwọ gbasara. Nke a mere na steeti Anambra. Ka a na-ekwu

Alụ: Obodo agbaala ụlọ ụka jikọrọ ụmụnne di na nwunye ọkụ

Image
NDỊ  ntorobịa n’Agba Ekwulobia, nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na Steeti Anambra agbaala otu ụlọụka ọkụ maka ịgba nwanne na nwanne otu nne ji akwụkwọ. Aha ụlọụka a bụ ‘Dwelling Fullness of God Church’, Ekwulobia. Chinwendu Uzoatu Chiadi Ezeibekwe, onye gbara afọ iri abụọ na ise kpọọrọ nwanne ya nwanyị dị afọ iri na asaa ga gbaa akwụkwọ n’ụlọ Uka a nke dị n’ogbe ha bụ Agba n’Ekwulobia. Akụkọ kọrO na onye ụkọchukwu gbara ha akwụkwọ bụ nwanne ha nwoke nke nnukwu, onye bụ ụkọchukwu n’ụlọụka ahụ, nke aha ya bụ Chijioke Ezeibekwe. Ọhaneze hụrụ nke a dịka nsọala nke mere ka ha tinye ọkụ n’ụlọụka ahụ. Chiadi Ezeibekwe bụ onye lụrụ nwanne ya nwanyị, gbadosiri ụkwụ ike n’ala site n’ịkọwa na akwụkwọ nsọ Deuteronomy 36:6 kwadoro nwanne ịlụ nwanne ya nne ji ya na ya. Otu o sila dị, otu onye ụka ahụ bụ Daniel Ezeobi, n’okwu o gwara ndị nta akụkọ, ekwenyeghị na nke a ma rụtụkwa aka n’akwụkwọ nsọ Lev. 18:19, ebe na-akwadoghị nwanne na nwanne ịlụ di na nwunye. Ezeobi kọwara alụm di na nwunye a dịka nsọ