A chụọụla ndịnkuzi iri na anọ na mahadum Akwa Ibom maka akwamiko
OZI e nwetara site n’aka Akwa Ibom State University na-akọwa na a gbaarala ndị nkuzi iri na anọ ụgbọ nwa mkpi n’ọrụ maka ịkwasa ụmụakwụkwọ iko. Ọ bụ eziokwu na ekwuputaghị aha ndị nkuzi ahụ, onyeisi (Vice Chancellor) mahadum ahụ nke steeti nwe, Ọkammụta Nse Essien kwuru na mahadum ahụ ga-aga n’ihu ịchụpụ ndị anaghị eme nke ọma ebe ahụ. N’okwu ya mgbe ọ kpọtụụrụ òtù ndị ntaakụkọ ,Nigeria Union of Journalists (NUJ) nke kansụl steeti Akwa Ibom, Ọkammụta Essien kọwara na 38 n’ime ihe ọmụmụ 42 mahadum ahụ na-eme enwetela ikikere zuu ezu (accreditation) site n’aka National University Commission (NUC). Ọkammụta Essien, onye ga-eme otu afọ n’ọrụ dịka onyeisi mahadum ahụ n’Ọgọstụ 3, gakwara n’ihu kwuo na ihe niile adigo otu o kwesịrị iji malite mgbasaozi redio nke mahadum ahụ. Ọkammụta ahụ bụ onye jibu ọkwa dịka kọmishọna na-ahụ maka mmụta kwere nkwa ezi mmekọrịta n’etiti NUJ na AKSU. N’okwu nke ya, onyeisioche NUJ, ‘Comrade’ Amos Etuk toro onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ maka ịkpọturu ndịntaa