Ejiji: Akwa e ji akpọchị akpịrị
AKWA e ji akpọchị akpịrị nke bekee kpọrọ ‘tie’ bụ ejiji pụrụ iche ụmụ mmadụ na-eji. Ọ bụ ejiji ọgbara ọhụrụ nke soro ndị ọcha bịa. N’oge gboo, ndị Igbo tinyere ndị ala Africa niile amaghị ihe bụ ịkpọchị akpịrị. Ma taa, ndị ala anyị na-akpọchizi akpịrị oge niile, ma mmiri ọ na-ezo, ma anwụ ọ na-acha. Oge ụfọdụ a na-ahụtaba onye kpọchịrị akpịrị ka onye gụrụ akwụkwọ maọbụ onye ọrụoyibo. Akwa e ji akpọchị akpịrị dị ụzọ abụọ. Otu na-akwụ ọtọ ebe nke ọzọ na-agba uhie. Ọ bụ ihe dị mma dịrị n’ahịa, nke onye chọrọ o goro were na-ekwe oyooyoo. Ya mere, ma nke kwụ ọtọ ma nke gbara uhie dịcha mma maka ha na-enye ihe a chọrọ. N’oge mbụ, ọ bụ ụmụnwoke na-akpọchikarị akpịrị; mana n’ụwa taa, ụmụnwaanyị esorola ụmụnwoke na-akpọchị akpịrị n’ihi na o nweghị onye ihe ọma sọrọ nsọ, nke ọzọ bụrụ na e kwuru sị na ihe na-agụ onye na-agụ onye ọ bụ ya na ya. Otu nwoke jụrụ ajụjụ sị: Olee uru akwa e ji akpọchị akpịrị bara? Ọ gara n’ihu kwuo na mgbe mmadụ yinyechara akwa nke ọma na ọ baghịzi uru na onye