Posts

Showing posts with the label Akuko Igbo

Anambra akwanyerela Mbazulike Amechi ùgwù ikpeazụ n'Awka

Image
Izunna Okafor dere akuko a ỌCHỊCHỊ steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee chịkọba mmemme nkwanyeùgwù pụrụ iche maka Dara Mbazulike Iwuchukwu Amechi lagoro mmụọ, bụ ezi nwaafọ steeti ahụ ji eme ọnụ ma bụrụkwa onye mbụ jiri ọkwa dịka Minista na-ahụ maka njem ụgbọelụ n'ala Nigeria.   Ya bụ odogwu nwoke, onye e jikwa “Dara Akụnwafor” wee mara, bụ onye nwụrụ n'ụtụtụ ụbọchị Tuzdee, abalị mbụ nke ọnwa Nọvemba afọ 2022. Ọ nwụrụ na be ya dị n'Ukpor, n'okpuruọchịchị Nnewi South nke steeti Anambra, ma bụrụkwa onye gbara afọ iri iteghete na atọ wee laa mmụọ.   N'okwu ya na mmemme ahụ a chịkọbara iji sị ya bụ agụ nwoke gaa ije ya nke ọma, aka na-achị Steeti Anambra bụ Gọvanọ Soludo kwuru na ọnwụ Amechi emetụtaghị naanị obodo ya bụ Ukpor, kama na ọ bụ nnukwu ihe funahị̀rị̀ ndị Igbo niile, obodo Nigeria, nà Africa n'izugbe.   Ọ kọwàrà ya dịka onye nwere nnukwu mmasị n'ihe gbasara ịkwàlite ọdịmma obodo ya, bụrụkwa olu na-adasị ụda ike n'òtù 'Zikist Movement'

E duola ndị ọkaikpe abụọ n'ọrụ n’Anambra

Image
  Izunna Okafor dere akuko a  AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo nọrọ na nsonso a wee duo mmadụ abụọ n'iyi ọrụ dịka ndị ọkaikpe na steeti ahụ. Mmemme idu n'iyi ọrụ ahụ bụ nke dọtara ụfọdụ mmadụ ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n'obi gọọmenti dị n'Awka.   Ka ọ na-edu ndị ahụ n'iyi ọrụ, Gọvanọ Soludo tụụrụ ha mmamma maka ọkwa ọhụụ ahụ, ma dụọ ha ka ha jigidesie ùgwù dịịrị ọrụ ahụ ike, ma rụkwa ọrụ ha nke ọma nà n'ikwesi ntụkwàsịobi, dịka o siri dị n'akwụkwọ iwu na-achị ala Nigeria.   Ọ kpọkuru ha ka ha wepu egwù, ma bụrụ ndị na-ebube eziokwu na ikpe nkwụmọtọ ụzọ n'ihe ọbụla ha na-eme, ma kwekwazie nkwà na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịnọnyere ha na ịkwàdò ngalaba ọrụ ikpe steeti ahụ.   Ọ kọwapụtara na e nwere ezi mmekọrịta n'etiti isi ọchịchị steeti ahụ na ngalaba ikpe na ya bụ steeti, ma mekwazie ka a mara na ọchịchị ya na-agbasi mbọ ike ugbua ịkwàlitekwù usoro ikpe nkwụmọtọ na steeti ahụ, ka ọ bụrụzie nke agaghị na-egbuzị oge inwe

Soludo agaala leta ebe ọ na-arụgasi okporoụzọ, gbapee ọrụ ụzọ ọhụrụ

Image
  AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwela nkwà na ọchịchị ya ga-aga n'ihu ịrụ ezi okporoụzọ na steeti ahụ, iwete ezi ọnọdụ mmepe, na ịrụnyesi ihe dị icheiche ga-enye aka ịkwàlite ọnọdụ mmepe steeti ahụ.     Gọvanọ Soludo kwuru nke a oge ọ gara leta ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n'ụfọdụ okporoụzọ dịgasị n'ime ime obodo, bụkwa ebe ọ nọrọ wee gbapee ọrụ n'ụfọdụ okporoụzọ ahụ.     Ebe dị icheiche Gọvanọ Soludo gàrà njem nleta ahụ gụnyèrè Okpuno dị n'okpuruọchịchị Awka South, Isuaniocha dị n'okpuruọchịchị Awka North, Ukpor dị n'okpuruọchịchị Nnewi South, Awba-Ofemili dị n'okpuruọchịchị Awka South, Ifitedunu dị n'okpuruọchịchị ime obodo Dunukofia, tinyere ụfọdụ ebe ndị ọzọ.   N'okwu ya n'ebe ahụ, Gọvanọ Soludo kọwàrà nà ebumnobi o jiri bịa njem nleta ahụ bụ ka o jiri anya ya hụ ka ọnọdụ siri dị ebe ahụ, mara ka ha bụ okporoụzọ siri mebidobe, na otu a ga-esi wee rụgharịa ha. O mèrè ka a mara na obi anaghị atọ gọọmenti ụtọ

Anambra ewubela amụmà nchekwa obodo maka ọnwa 'mber’

STEETI Anambra eguzobela amụma ọlụ nchekwa pụrụ iche maka ọnwa ‘mber’ iji hụ na e nwere nchekwa bụ ịgbà na steeti ahụ n’ime ọnwa ‘mber’ a nọ n’ime ya. Mmemme igùzòbe ya bụ amụma ọlụ nchekwa bụ nke  weere ọnọdụ ụbọchị Mọndè, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu na ngalaba ọlụ nchekwa na steeti ahụ. N’okwu ya, dịka ọ na-egùzobe amụmà ahụ, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kọwara na ebumnobi nkè ahụ bụ iji wèta ezi nchekwa na gburugburu niile nke steeti ahụ, site na ngagharị ndị ọlụ nchekwa n’ebe dị iche iche oge ọbụla, inyochasị ihe na ebe kwesiri na ebe dị àñaa, ma na-etinyekwa atụmatụ ọlụ nchekwa dị iche iche n’ọlụ, ọ kachasị ugbu a oge ekeresimeesi na-akpụdòbe nso. O mere ka a mara na ọchịchị ya amalitela itinyesi akụrụngwa nchekwa bụ CCTV karịrị puku iri ise n’ọnụ ọgụgụ n’ọtụtụ ebe dị iche iche na steeti ahụ, nke a ga na-eleru anya site n’aka ndị ọkachamara, bụkwa nke ga-enye aka inyòpù na igbòchi mpụ na arụrụ ala. Ọ kpọkuzịrị ụmụafọ steeti

Aka akparala nwoke tọọrọ nne enyi ya nwanyị

AKA ndị uweojii akparala otu nwoke gbara afọ iri abụọ na anọ aha ya bụ Chinedu Innocent, maka itinye aka n’itọrọ nne enyi ya nwanyị. Nke a mere n’okpuru ọchịchị Ukwa West na steeti Abia. Innocent na mmadụ atọ ndị ọzọ bụ Ekendu Chidiebere, Tochukwu Samuel na Ikechukwu Nwankwo gbara izu ime ihe ọjọọ ahụ. Anwụchịkọrọ ha n’Abuja abali olemole ha natachara puku narị naịra atọ (N300,000) site n’aka ikwu na ibe nwanyị ahụ. Ozi e nwetara n’aka ndị uweojii kọwara na ndị ntọrị ahụ bụ ndị nọzi na ‘Force Headquarters’, Abuja, bụ ndị e jidere n’ihi nkpesa nke otu onye ikwu na ibe nwanyị ahụ bụ Agnes Semion kpesaara onye isi ndị uweojii  bụ Ibrahim Idris. Otu onye kọkwara na Innocent bụ onye nke e buuru ya na nwanyị ahụ wee pụọ ụbochị a tọọrọ ya n’Aparazu Ogwu na steeti Abia maara ụzọ ya bụ mmiri siri baa n’opi ụgbogụrụ. E kwuru na Innocent nọ na be nwanyị ahụ mgbe ndị ntori ahụ bịara; ha buuru ha abụọ pụọ. Ka a hapụchara nwanyị ahụ ka ọ laa, Innocent gara n’ihu na-agwa ya ka o mee ka ezinaụlọ ya kw