Ndị na-akọpụta ọka etoola Gọọmenti Etiti maka nkwado
ÒTÙ na-akọpụta ọka n’ala anyị The Maize Association of Nigeria (MAAN) akpọkuola gọọmenti Nigeria ka ha nọgidesie ike na mmachị ha machiri ibubata ọka n’ala anyị, iji mee ka a na-akọpụta ọka n’ebe ọ dị ukwuu ma bụrụkwa nke ga-agba ndị ọrụugbo ume. Onyeisi MAAN n’ala anyị bụ Dọkịnta Bello Abubakar kpọrọ oku a na nhibe (inauguration) mbụ nke piramiidi ọka, National Maize Pyramids na emume mmalite (flag-off) ọrụugbo oge udu mmiri 2021, nke MAAN chịkọbara na njikọaka Central Bank of Nigeria na steeti Kastina. Dọkịnta Abubakar kwuru na ka ọ dị ugbu a, ndị ọrụugbo na-akọ ọka n’ala anyị na-akọpụta ole na-ezuru ndị Nigeria. O kwuru sị: “Anyị na-akagbu ibubata ọka site na mba ọzọ, anyị ga na-aganihu oge niile na-ekene Central Bank of Nigeria maka ijụ nnabata maọbụ ịkwado ndị na-atụbata ọka (importers) n’ihi na CBN kwadoro amụma onyeisiala Muhammadu Buhari, nke bụ ‘rie ihe anyị rụpụtara ma rụpụta ihe anyị na-eri.’ Dịka o si gbasata ọka,anyị ga akọpụtali ole ga-ezuru anyị oriri,tinyere iji h