Ụzọ iri mmadụ ga-eso iji gbochie nsogbu akụrụ
ỌBARA mgbali elu na ọrịa shuga (diabetes) so n’ihe na-akpata nsogbu akụrụ (kidney). Nke a mere na ị ga na-elebara otu shuga si agbago ma na-agbatu 2. Gbaa mbọ hụ na ị bughị oke ibu (weight) n’ihi na ibu oke ibu nwere ọghọ m dị egwu nke nwere ike ibute nsogbu akụrụ 3. Rie nri ndị na-edozi obi dịka mkpụrụosisi, akwụkwọ nri w.d.g 4. Wetuo aka n’iri oke nnu 5. Hụ na ị na-ańụ mmiri dịka o kwesịrị 6. Wetuo aka n’ịńụ mmanya ọkụ 7. Gbaara ise sịga ọsọ n’ihi na ọ na-emebi akụrụ 8. Belata oke ịńụ ọgwụ na-akwụsị ahụ ịgbu mgbu 9. Belata oke mgbagharị na nchekasị 10. Gbaa mbọ hụ na ị na-enwe ezi mmegharị ahụ (exercise), dịka igwu mmiri, ịga ije, ịgba ọsọ n’ihi na ha na-ahazi ọbara mgbalị elu na ọnọdụ shuga, tinyere ọnọdụ ahụ niile ma mee ka mmadụ ha otu kwesịrị ekwesi n’ibu.