Akụkọ mgbede: Nwaagbogho na nkita eze
OTU eze na-achi obodo gwara onye ozi ya ka o kuo ekwe ka a gwa oha obodo na ya choro ilu nwanyi ohuru. Onye eze a bu ezigbo onye ochichi nke nwere ihe aku aku na ihe enwe enwe. Ihe uwa bu aturu taba n’obi ya. Ndi obodo o na-achi hukwara ya n’anya nke ukwu. Mgbe a kuru ekwe ma mkwaa okwa na eze ga-alu nwayi ohuru, ndi obodo a turu uzu ma nwekwaa nnukwu onu. Nke a mere na e weputara otu ubochi nke umuagboho nile no n’obodo ahu ga-abia gbaa egwu n’obi eze ka eze wee horo onye masiri ya. Nne na nna bidoro kwadowe umu ha ndi umuagbohobia n’ike n’ike. E nyere ha otu onwa iji mee nke a. e bidoro nyewe umuagbohobia ezigbo nni nke juputara n’anu na azu, ka ahu ha waa maa poko poko. E bidokwara tebe ha uhie na ihe ndi ozo di iche iche e ji acho anu ahu mma. Ufodu nne na nna kwusiri umuagbohobia ha iji ozi obuna. Umuagboho bidoro were ngala na-akwodobe maka amaghi onye eze ga-ahoro. Ka a na-eme nke a, o nwere otu nwa enwe nne enwe nna nke no n’otu ezinaulo. So nwagbogho a ka nne nna ya mut