Posts

Showing posts with the label Akụkọ mgbede

Akụkọ mgbede: Nwaagbogho na nkita eze

OTU eze na-achi obodo gwara onye ozi ya ka o kuo ekwe ka a gwa oha obodo na ya choro ilu nwanyi ohuru. Onye eze a bu ezigbo onye ochichi nke nwere ihe aku aku na ihe enwe enwe. Ihe  uwa bu aturu taba n’obi ya. Ndi obodo o na-achi hukwara ya n’anya nke ukwu. Mgbe a kuru ekwe ma mkwaa okwa na eze ga-alu nwayi ohuru, ndi obodo a turu uzu ma nwekwaa nnukwu onu. Nke a mere na e weputara otu ubochi nke umuagboho nile no n’obodo ahu ga-abia gbaa egwu n’obi eze ka eze wee horo onye masiri ya.   Nne na nna bidoro kwadowe umu ha ndi umuagbohobia n’ike n’ike. E nyere ha otu onwa iji mee nke a. e bidoro nyewe umuagbohobia ezigbo nni nke juputara n’anu na azu, ka ahu ha waa maa poko poko.   E bidokwara tebe ha uhie na ihe ndi ozo di iche iche e ji acho anu ahu mma. Ufodu nne na nna kwusiri umuagbohobia ha iji ozi obuna. Umuagboho bidoro were ngala na-akwodobe maka amaghi onye eze ga-ahoro.   Ka a na-eme nke a, o nwere otu nwa enwe nne enwe nna nke no n’otu ezinaulo. So nwagbogho a ka nne nna ya mut

Akụkọ mgbede: Nwanyị loro akwa eke

O NWERE otu oge, ụmụnwanyị na-aga ọrụ ugbo wee pụta n’ụzọ hụ akwa bu sọ mma. Akwa ndị a mara mma, gbaa okpokoro ma na etokwa akpịrị.Ka ha kirichara akwa ndị a,ha chọpụtara na ọ bụ akwa eke. Otu onye n’ime ha kwuru na ya ga-achịrị akwa ndi a rie. Ha sịr\ị ya a nwakwala anwa rie akwa ndị ahụ na anaghị eri ya eri. Ma nwanyị ahụ gwara ha na nke ahụ gbasara ha na ihe ọsọrọ ya mee, na ya ga eririri akwa ahụ. Mgbe ha kparịtachara ụka ,onye ọ bụna gawara n’ubi ya.   Mgbe ha rụchara ọrụ wee na alọta n’uhuruchi, ha pụtakwara ebe ahụ ha hụrụ akwa eke n’akụkụ ọhịa. Nwanyị ahụ kwuru na ya ga-eriri akwa ndị ahụ hulatara chịkọrọ akwa ahụ nlie  wụnye n’abọ ya. Ụmụnwanyị ibe ya tiri mkpu ma dọọ ya aka na ntị ka ọ wụsa akwa ndị ahụ  ma ekwe akụtaghị onye ala ji.   Mgbe nwanyị ahụ laruru n’ụlọ ya, ndị be ya lelechara akwa ahụ ma gwakwa ya ka o ghara iri ha n’ihi na anaghị eri akwa eke eri; ma nwanyị ahọ kpọchiri ntị chịrị akwa ndị ahụ wụnye n’ite, gbanye ya mmiri sinye n’ọkụ.Mgbe o bidoro sụba asụ, ihe i