Ndị NUJ Anambra ejirila ọṅụ mechie afọ
Ọ BỤ nnukwu mmemme jupụtàrà n’obi aṅụrị, dịka òtù jikọtara ndị ntaakụkọ n’ime steeti Anambra, bụ nke a maara na bekee dịka ‘Nigeria Union of Journalists (NUJ)’ gbakọ̀tara wee pịachie akwụkwọ maka afọ 2022. Nnukwu mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọọrụ ndị ntaakụkọ ahụ dị n’Awka ụbọchị Wenezdee, ma bụrụkwa nke imirikiti ndị òtù ahụ, ụmụakwụkwọ, na ndị e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị icheiche sonyere nà ya. N’ozi nnọọ ya n’ebe ahụ, onyeisi NUJ n’ime steeti Anambra bụ Dọkịta Odogwu Emeka Odogwu fọ̀rọ̀ ekele n’ụkpa wee bunye ndị òtù ahụ maka ọmarịcha nkwàdó dị icheiche ha nyèrè ọchịchị ya n’ime afọ a, n’ihi na ọ bụ n’ime afọ a ka ọ banyere n’ọkwa dịka onyeisi òtù ahụ. Ọ kpọpụtasịrị̀ ụfọdụ ihe dị icheiche ya na ndị òtù ya mepụtagoro, ma kelekwazie ndị mmadụ na ndị òtù dị icheiche nyere ha na ndị NUJ Anambra nkwàdó n’otu ụzọ maọbụ nke ọzọ, ọbụna dịka o kwupụtàrà olileanya o nwere na afọ na-abịa abịa ga-amakarị nke a. Ọ dụ̀kwàzị̀rị̀ ụmụakwụkwọ sonyere nà mmemme ahụ ọdụ ka ha d