Posts

Showing posts with the label Ajọ ndụ

Ihe ọjọọ na-apụta n'ajọ ndụ

AJỌ ndụ nke mmadụ ụfọdụ na-ebi bụ nke na-eweta ọtụtụ nsogbu. Ndụ dị otu a bụkwa nke onye ọ bụla na- ebi ya adịghị ekwe mgbe a na-adụ ya ọdụ. Nke a bụkwa ụfọdụ n’ime ndụ ahụ; ịńụbiga mmanya oke, ise anwụrụ ike, ịńụ ọgwụ ike, ịgba akwụna , ịtọrọ mmadụ, ịgba mgbere mmadụ, izu ohi, ịzụ ahịa iwu, nakwa iji igwe kọmpụta na-ezu ohi. Ihe ọjọọ ndị a niile na-eme ka onye ọbụla na-eme ya baa na nsogbu, ya na ezinaụlọ ya agaghị ebenwu. N’ezie, a agwa ọjọọ ndị a e dere ebe a ma ndị edeghị anyị ga- elebara anya n’ole na ole ma kwuo maka ihe ọ na- apụta n’ikpeazụ. Onye ọbụla na ańụbiga mmanya oke na-enwe ọtụtụ nsogbu. Nke mbụ: ọ gaghị enwe ike ijide ego, ego ọbụla batara ya aka ọ ga- eji ya ńụọ mmanya, ọ gaghị echeta ezinaụlọ ya. Oge ụfọdụ ọ bịa ya ọrịa, ọgaghị enwe ike ịchụta ihe ọ ga-eri na ịma ya ahụ jijiji, ọ ga-atọgboro n’elu akwa n’ele anya onye ga-enyere ya aka. Ihe jọgburu onwe ya bụ na n’ihi ndụ ọjọọ a na-ebi ọgaghị edebe ego n’ụlọ ya ma ọ bụ n’ụlọ ọba ego ka e were zọba ya ma o nwee ọdachi.