Aguluezechukwu eriela ji ọhụrụ
Chinwendu Uzoatu DỊKA a nọ n’emume iri ji ọhụrụ ugbua, ndị Aguluezechukwu, nke dị n’okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra nọ na Satọdee gara aga mee emume iri ji ọhụrụ. Nkea kpọlọtara ndị Aguluezechukwu nile ụlọ ka ha zukoo wee rie ji ọhụrụ dịka ụmụnne. Igwe Aguluezechukwu bụ Igwe Felix Ebelendu, kelere Chineke ma gozie ndị obodo ahụ nile. Ọ gọrọ ọfọ sị ka ọ dịrị ha na mma ma gọtakwara ndị obodo ya ndụ, nka na uju amara. Ka Igwe gọchara ọfọ, ọ wara ji, ebe ndị mmadụ ji ọñụ, itu ụzụ na ịkụ aka wee na-añụrị. ‘President General’ otu Iganihu Aguluezechukwu bụ Ifedi Okoye, ji ịhụnanya na obioma wee nabata ọha na eze, ndị gụnyere ndị obodo ahụ na ndị si mba ndị ọzọ dị iche iche wee bịa. Otu onye so na ndị e ji okwu ha agba izu n’Aguluezechukwu bụ Nze Godwin Ezeuko kwuru sị, “obi juputara m n’ọñụ n’ihi iri ji nke afọ a. A na m ekwu sị na nke afọ ọzọ, 2019, ga-aka nke afọ a mma. Ihe dịrị onye ọbụna mma. Ka Chukwu gozie mmadu nile.” Ndị mmadụ bupụtachara ji ha kọrọ bụ ndị buru nnukwu ibu k