Igwe Agulezechukwu echiela ndị ichie ọhụrụ
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtu n’obi Igwe Felix Ebelendu, Nnanyelugo n’Agulezechukwu nke dị n’ Aguata, dika e kpunyere ụmụnwoke iri anọ na abụọ okpu dịka ndị ichie n’obodo ahụ. Igwe Nnanyereugo n’Agulezechukwu n’okwu ya kọwara na ọ bụ n’afọ 1976 ka e chiri ya Igwe Agulezechukwu. O mechaara họpụta ndị ichie ya na ha na-alụ ọlụ, mana ka ihe siri diri imirikiti n’ime ha alaana mmụọ nke mere na a na- ahọpụta ndị ọzọ ka ọlụ obodo wee na-aga. Ọ kọwara na ebumnobi e ji echi ichie bụ ka ụmụnna ọbụna nwee ike mara ihe na-eme n’obodo ka o wee na-aga n’ihu. ọ gakwara n’ihu kọwaa sị. “Ihe a tụrụ anya n’aka ndị ichie bụ ikwu eziokwu, onye hụ ihe dị ọcha o kwuo na ọ di ocha, onye hụkwanu nke dị oji o kwuo na ọ dị oji” Igwe Nnanyerugo kwukwara na udo ga-ebido n’ezinaulo ha, ruo ụmụnna wee pụta n’obodo. Ọ gọọrọ Agulezechukwu ọfọ ihe ọma ma kpekwaa ka e nwee ezi nhọpụta ọchichi n’ala Nigeria dika e si mee na steeti Anambra. Otu nwanyị onye Agulezechukwu aha ya bụ Oriaku Agatha Obiageri Chukwuma kọwara na ọ bụ Omenal