Enugwu-Ukwu na Agu Ukwu Nri ka na-azọ ndị bụ isi n'ala Igbo
NDỊ Enugwu-Ukwu na Agu-Ukwu Nri dị na steeti Anambra na-azọndị bụ isi agbụrụ Igbo, ndị bụ diọkpara Nri mụtara Enugwu-Ukwu, Nawfia, EnugwuAgidi na Agu-Ukwu Nri. Onye eze ọdịnala ndị Enugwu-Ukwu, Igwe Ralph Ekpe n’ozi ọkụpụụrụ ndị ntaakụkọ kwuputara na Enugwu-Ukwu bụ diọkpara n’ime Umunri nwokeniile. Dịka Igwe Ekpe sirikwu, anaghị agbagha ya agbagha obodo bụ isi n’ime obodo anọ a kacha mara dịkandị Umunri. Onye eze ahụ kwuputara na ndị Nri azaghị ya na mbọ ọ gbara ịkpọ ndịobodo Umunri oku nzukọ na nsonso a, ma kwekwa nkwa ikpọkwa oku ahụ ọzọ maka ịkpamaka ihe ga-amịta ezi mmịmmị. Ọ kọwara na ahaotutu (title) Eze Nri abụghị nke Umunri ọbụla n’ihi na a nọ na-ebughari ya(rotation) n’ime ụmụnne ahụ bụ ndị na-esonye n’emume Eze Nri Igụ Arọ nke ana-eme na Nri tupu ndị Enugwu-Ukwu ekewapụ wee bido Igụ arọ nke ha ọtụtụ afọgara aga. N’akụkụ nke yan’isiokwu ahụ, Prince Ikenna Onyeso so na ndị ọnụ ruru n’okwu na Nri kwukwarana ọ bụ na Nri ka Igbo si malite ma buru ndị jị ọfọ Igbo (sacred staf