Posts

Showing posts with the label Agụmagụ odinala

Agụmagụ ọdịnala ndị Igbo (2)

N’IZUỤKA gara aga, anyị kwuputara agụmagụ ọdịnala dị iche iche, ma nye ọmụmaatụ ilu. Taa anyị ga-eleba anya n’agwụgwa na okwumgbawaọnụ/okwuntabiire. Agwụgwa:- Agwụgwa bụ otu n’ime agụmagụ ọdịnala e nwere n’ala Igbo. Ọ na-adị n’ụdị ajụjụ ma bụrụkwa nke a na-echemi echiche ime tupu e nweta azịza ya. A na-akpọkwa ya ‘gwam gwam gwam’ n’ihi na ọ bụ otu e si amalite ya dịka anyị maara na ọ na-abịa n’ụdị ajụjụ. Ọmụmaatụ agwụgwa: Gwam gwam gwam ihe kụrụ aka baa ọhịa — Azịza ya bụ ụkpaka. Gwam gwam gwam ihe ji ikpere gazuo ubi nna gị –Azịza ya bụ ọgụ Gwam ihe ku mmiri rigoo elu — Azịza ya bụ Akụoyibo Gwam ihe na-achị gị waka n’ubi nna gị — Akwụkwọ akpụ. Gwam akwụkwọ ugiri ada n’ukwu ugiri — Nwanne anaghị alụ nwanne Gwam ihe ọgaranya jiri rachaa ntụ — Ube Gwam ude a sụrụ na mba a nụ ya na mba – Egbe Gwam mmadụ abụọ na-aga n’ụzọ, mmiri na-ama otu onye ma ọ naghị ama onye nke ọzọ — Nwaanyị dị ime. Gwam ihe gbara aka baa ubi chịrị ụmụ pụta – Ede Okwumgbawaọnụ/Okwuntabiire:- Nke a bụ okwu ndị yiri o

Uru agụmagụ ọdịnala bara

Image
AGỤMAGỤ ọdịnala bụ agụmagụ si n’aka fere aka. Ọ bụ agụmagụ dị ọkpụ nke si n’aka nna nna anyị ha wee rute anyị aka. Ọ na-esi n’otu ọgbọ gafere n’ọgbọ ọzọ. O nweghị otu onye a ga-asi na ọ bụ ya nwe udị agụmagụ ọdịnala ọbụla n’ihi na mgbe e chepụtara ha, edeghị ya ede. Agụmagụ ọdịnala dịka anyị maara gụnyere akụkọ ifo, ilu, agwụgwa, akpaalaokwu, w.d.g. N’ihi na edeghị ya ede oge e chepụtara ya, ọ na-enwe mgbanwe. Ọ na-enwe ntinye ma ọ bụ nwepụ n’ebe ụfọdụ. Iji maa atụ, ọtụtụ akụko ifo na-abụ otu mana otu e si akọ ha na-adị iche iche. Ihe kpatara nkea bụ n’ihi na ebe ọ bụ site n’ọnụ fere n’ọnụ, ọtụtụ ndị mmadụ na-eme ntinye ma ọ bụ mwepụ na ha. Agụmagụ ọdịnala na-ebu ndị a na-ewepụtara ya n’obi. Iji maa atụ, n’ihi akụkọ ifo bụ maka ụmụaka kpọmkwem, asụsụ e ji akọ ya na-adị mfe; agwa ndị na-abata na ya na-adị olemole. A bịa n’egwu mọọbụ abụ, a na-ebupụtara ọhaneze, tụmadi ndị katarala ahụ, mgbe ụfọdụ ọ na-ebu ὶkpè nke ilu na ụkabụilu na-ejupụta na ya. N’oge mbụ, anaghị ede agụmagụ ọdịnala e

Agụmagụ odinala ndị Igbo

Victor Maduagwuna   AGỤMAGỤ odinala bụ echiche miri emi nke nna nna anyị chere banyere isiokwu dị iche iche ma were asụsụ nka kọwapụta ya. Agụmagụ odinala abụghị akụkọ e deturu edetu n’akwụkwọ n’ihi na ndị nna nna anyị ha bụ ndị na-akọ ya amaghị ede nke ha ji ama agụ akwụkwọ. Ọ bụ ọnụ nkiti ka ha ji akọrọ ụmụ ha nakwa ụmụ ụmụ ha, ụmụ ha sikwa otu ahụ kọọrọ ụmụ ha na ụmụ ụmụ ha. Ọ bụ nwa nwa tota o tokwuru. Agụmagụ ọdịnal ndị Igbo dịka omenala ha. Ọ na-esi n’aka efere n’aka. Ma n’oge ugbua, n’ihi mmuta, agụm na edem akwụkwọ ndị Igbo nwebegoro, nakwa ọgbara ọhụrụ dị iche iche, ndị ọkammụta ụfọdụ chịkọbara ụfodụ n’ime akụkọ ndị a, ma dee ha n’akwụkwọ. Ebumnobi ha bụ ka akụkọ amamihe ndị nna nna anyị ha ghara ifu n’anya anyị. Ha mere ya maka ichekwa ha na omenala ndị Igbo. Na e deturu agụmagụ odinala n’akwụkwọ emeghị ka ọ bụrụ agụmagụ ugbua, kama ọ busị agụmagụ odinala ndị e dere ede n’akwụkwọ. Agụmagụ odinala na-apụta ihe n’ọkpụrụkpụ uzo atọ ndị a, akụkọ, ejije ma ọ bụ egwuriegwu, nakwa a