Posts

Showing posts with the label Agụmagụ

Agụmagụ ọdịnala ndị Igbo (2)

N’IZUỤKA gara aga, anyị kwuputara agụmagụ ọdịnala dị iche iche, ma nye ọmụmaatụ ilu. Taa anyị ga-eleba anya n’agwụgwa na okwumgbawaọnụ/okwuntabiire. Agwụgwa:- Agwụgwa bụ otu n’ime agụmagụ ọdịnala e nwere n’ala Igbo. Ọ na-adị n’ụdị ajụjụ ma bụrụkwa nke a na-echemi echiche ime tupu e nweta azịza ya. A na-akpọkwa ya ‘gwam gwam gwam’ n’ihi na ọ bụ otu e si amalite ya dịka anyị maara na ọ na-abịa n’ụdị ajụjụ. Ọmụmaatụ agwụgwa: Gwam gwam gwam ihe kụrụ aka baa ọhịa — Azịza ya bụ ụkpaka. Gwam gwam gwam ihe ji ikpere gazuo ubi nna gị –Azịza ya bụ ọgụ Gwam ihe ku mmiri rigoo elu — Azịza ya bụ Akụoyibo Gwam ihe na-achị gị waka n’ubi nna gị — Akwụkwọ akpụ. Gwam akwụkwọ ugiri ada n’ukwu ugiri — Nwanne anaghị alụ nwanne Gwam ihe ọgaranya jiri rachaa ntụ — Ube Gwam ude a sụrụ na mba a nụ ya na mba – Egbe Gwam mmadụ abụọ na-aga n’ụzọ, mmiri na-ama otu onye ma ọ naghị ama onye nke ọzọ — Nwaanyị dị ime. Gwam ihe gbara aka baa ubi chịrị ụmụ pụta – Ede Okwumgbawaọnụ/Okwuntabiire:- Nke a bụ okwu ndị yiri o