Posts

Showing posts with the label Adisa Fumilola

Nwaanyị agbagbuola nwa o ku n'aka na bọkeeti mmiri

OTU nwaanyị aha ya bụ Adisa Fumilola, egbuola nwa o ku n’akasite n’itinye ya n’ime bọkeeti mmiri, ọ nwụọ pịị.   Nwaanyị ahụ gbara afọiri abụọ na abụọ kwuru na iwe ya o jiri gbu nwata ahụ gbara otu afọ na ọnwaisii bụ maka na ọ bụ ya gbochiri ya ịba mahadum gụọ ihe ọmụmụ banyere iwu(law).   Ọ bụ n’ụlọ ha nke dịna Gowon Estate, Lagos ka ọ nọrọ kpa arụ ahụ ụbọchị Monde ma gaa n’ogige ndịuweojii nye mkpesa.   Dịka ndị uweojiina-agba ya ajụjụ ọ sịrị na ọ bụ onwe mmadụ igba ya gharịị (frustration) tinyereya n’ịkpa agwa ọjọọ ahụ, ma kwukwaa na nwata ahụ gbochiri ya imezu ebumnobu yanke bụ ibụ ọkaiwu (lawyer).   Ọ kọwara na otunwoke aha ya bụ Yusuf Folarin tụbara ya ime oge ha abụọ na-aga akwụkwọ maka uleJoint Admission and Matriculation Board (JAMB). Nwoke ahụ dịka o siri kwu, gọnahụrụya ma gwa ya ka o wepụ afọ ime ahụ.   Ka o mechara turuugo ịbanye mahadum Obafemi Awolowo University, Ile Ife nke dị na steeti Osun ịgụihe ọmụmụ banyere iwu, onweghịzị ike imeju ebumnobi ya n’ihi nwata ahụ.   Fol