Posts

Showing posts with the label Ada Mbanese 2021

Ada Mbanese 2021: Ụmụagbọghọ atọ enwetela mmeri Kwuo ihe ha ga-eme iji kwàlite mmepe obodo

ỤMỤAGBỌGHỌ atọ chara acha ma makwa mma ihu na mma àgwà eturula ùgò n’asọmpi mmā a chịkọbara maka ụmụagbọghọ nọ na Mbanese, bụ nke a kpọrọ ‘Miss Mbanese Beauty Pageantry’ nke ahọ 2021.   Ya bụ asọmpi Ada Mbanese 2021 bụ nke ọtụtụ ụmụagbọghọ sitere obodo ise mejupụtara mpaghara Mbanese dị n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’ nke steeti Anambra sonyere na ya, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ na nsonso a, n’ụlọ nkwariakụ ‘Tripple Fish’ dị n’Ụtụh.   Obodo ise ndị a mejupụtara mbanese gụnyere Ebenator, Osumenyi, Utuh, Ezinifite na Akwaihedi ma bụrụkwa ebe imirikiti mmadụ siri wee pụta wee sonyesie ike na mmemme ahụ, iji kwàdo ndị nke ha sonyere n’asọmpi ahụ ụbọchị ahụ, maka na ọ na-abụ azụ hụ nwanne ya n’ohimiri, ò gwùsie mmiri ike.   A nọkwazịrị na ya bụ oke ụbọchị wee gụpụta mmadụ atọ tuuru ùgò n’asọmpi ahụ ma bụrụkwa ndị e nyere ihe nrita dị iche iche, kpùbe ha òkpú, ma jie ha ejiji, dịka nturuugo ha nwetara siri dị, nke gụnyere Ada Mbanese 2021 (maka onye gbara onye nke mbụ), Ada Njèm Nlegharịanya M