Posts

Showing posts with the label Action Alliance

N'Awka, Action Alliance ehibela ọnọdụ na steeti Anambra

OTU ndọrọndọrọ ọchịchị Action Alliance (AA) nọ na Satọdee gara aga ọnwa Epure dị n’abalị iri na asaa wee hibe ọnọdụ ha (Secretariat) n’Awka, steeti Anambra. Emume  ahụ bụ nnọọ nke ndị isi ọchịchị ha si mpaghara dị iche iche n’ala anyị wee wụchaa n’Awka, nke onyeisioche ha n’ala anyị bụ  Adekunle Rufai Omo-Aje nọ n’isi ya.   N’ozi ya, onyeisioche otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ na steeti Anambra  Justina Nonyerem Ekeji nabatara ndị ahụ bịara njem ahụ, ma kelee Chineke maka idute ha steeti Anambra n’udo dịka ọ rịọkwara nchedo ya n’isi ha niile n’otu n’otu ka ha nọ na njem ahụ.   O kwuru sị: “Nje m ụnụ bịara na steeti Anambra ewulitela nchekwube anyị n’ebe otu ndọrọndọrọ ọchịchị Action Alliance nọ. O wetala ịgba ume na ngozi n’ebe onye ọbụla so n’otu a na steeti Anambra nọ. Action Alliance, dịka ị nọ n’isi ya abụrụla otu ndọrọndọrọ ọchịchị e wugharịrị nke na onye ọbụla so na ya nwere ezi ntụkwasa obi na ya nọ n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị dị mma. Mụ na ndị otu m na steeti Anambra dịka anyị na-esony