Mbize: Ndị Achina akpọọla gọọmenti oku enyemaka
ONYE ụlọ ya na-agba ọkụ ọ na-achụ oke? E ji ihe e ji agba nantị agba n’anya? Azịza bụ mba! ọ bụ n’ihi nke a ka otu nwa afọ Achina, nke dịn’okpuru ọchịchị Aguata ji ebeku gọọmenti etiti na nke steeti Anambra ka ọgbatara ha ọso enyemaka dịka mbize na-achọ ikpochapụ ha. Dịka ya na Ka Ọ DịTaa na-akparịta nkata, Nze Anthony Ezenwaka, NPOM (Nzedigbo), ode akwụkwọ ọkpụtọrọkpụna steeti Anambra lara ezumike n’ọrụ, ma bụrụ onye ndu obodo kwara arịrị ọnọdụ ọjọọnke mbize debere ala nna ya bụ Achina. O kwuru sị: “Ihe a na-akpọ ebe mbize ahụna-agba bụ Okparanwa Erosion Site, nke dị n’ụkpaka Amanje, Umueleke Achina;n’ogologo ụzọ si Achina gaa Umuchu. O malitere ihe dịka afọ iri na ise garaaga, ma na-abawanye n’ike n’ike n’ihi oke mmiri ozizo na ide mmiri na-ekwoekwo”. Ọ kọwara na ndị obodo ahụ agbaala mbọ igbochi ajọ ọnọdu ahụsite n’igwu ụmị/nti mmịrị na ịtunye ihe dịka akpa aja ebe ahụ iji sụchie ya, matinyekwara ịkụ osisi, ọ kachasị achara (bamboo tree) n’ime ya. Mana mbọ haniile amịtaghị mmịmị n