Nri ndị Igbo: Achịcha na fịọfịọ
ACHỊCHA na fịọfịọ bụ nri ndị Igbo. Oge e ji erikarị nrị a bụ oge ụganị. Oge ahụ ji na ihe oriri adịla ụkọ. Oge ahụ ezinụlọ ọ bụla mara ka e si ahazi ihe oriri atọtuo nkata achịcha, malitezie na-enwere ya nwayọọ nwayọọ na-esi ya n’ụdị dị iche iche. Ngwa ka anyị mara ka e si akwado ma na-esi achịcha na fịọfịọ. I weta achịcha, i suo ya kịrịkịrị, denye ya mmiri ọ gaa otu awa, ị saa ya mmiri, gbanye ya mmiri ọzọ. I sinye fịọfịọ, i were akwụkwọ unere kechie achịcha ahụ tinye ya n’ime fịọfịọ. Fịọfịọ ahụ ghee, ị mara na achịcha e gheela. I tọpụ achịcha, ị wụnye ya na nyọ, ị wụpụkwa fịọfịọ na nyọ i sinye ite n’ọkụ ị gbanye mmanụ, ọ dị ọkụ, ị wụnye yabasi, o ghee ị wụnye ose, ịra, nnu na ụkpaka; o ghee ị wunye achịcha na fịọfịọ, ị gwọkọọ ya ọnụ. Ị gwọkọsịa ya nke ọma, ọ bụrụzie oriri.