N'Abakaliki, onye ara ejirila osisi kụgbuo onye ọgbatumtum
NDỊ mmadụ nọ na nwute n’ihi na onye ara kụgburu onye ọgbatumtum(ọkada),n’Abakaliki, isi steeti Ebonyi. A kọwara na onye ahụlara mmụọ, Maazị Elias Ofoke, bụ onye Agbaja Unuhu n’okpuru ọchịchị Abakalikika onye ara ahụ kụgburu ka ọ kwụsịchara mmadụ n’akụkụ ebe ọ nọ. Onye ara ahụ ka ekwuru na ọ bụ kemgbe izuụka abụọ gara aga ka o ji eyi egwu n’isiobodo ahụ nkemere na ndị mmadụ nọ n’egwu ma na-agbakwa ọsọ ndụ ha mgbe ọbụla ha hụrụ ya,n’ihi na ọ na-eji ihe na-emerụ mmadụ ahụ mgbe ọbụla. E kwukwara na ndị ọrụnchekwa Neighborhood Security Watch adịla na mbụ gbaa mbọ ka ha nwụchikọọ onyeara ahụ mana onweghị isi n’ihi na o kweghị ha njide. Otu onye nọ ka ya bụnjinji jiri ma bụrụ onye achọghị ka a kpọọ aha ya kọwara na ka onye ọkada ahụkwụsịchara onye o bu ma na-achọ ka ọ pụọ, onye ara ahụ wakporo ya ma kụọ yaogbe osisi o ji n’isi nke mere ka ọ nwụọ. Onye DivisionalPolice Officer (DPO) kpirikpiri Division, SP Chris Anyanwu, onye nke kwuputarana ya bụ ihe mere n’ezie dụrụ ndị otu na-anya