Posts

Showing posts with the label Abakaliki

N'Abakaliki, onye ara ejirila osisi kụgbuo onye ọgbatumtum

NDỊ mmadụ nọ na nwute n’ihi na onye ara kụgburu onye ọgbatumtum(ọkada),n’Abakaliki, isi steeti Ebonyi.   A kọwara na onye ahụlara mmụọ, Maazị Elias Ofoke, bụ onye Agbaja Unuhu n’okpuru ọchịchị Abakalikika onye ara ahụ kụgburu ka ọ kwụsịchara mmadụ n’akụkụ ebe ọ nọ.   Onye ara ahụ ka ekwuru na ọ bụ kemgbe izuụka abụọ gara aga ka o ji eyi egwu n’isiobodo ahụ nkemere na ndị mmadụ nọ n’egwu ma na-agbakwa ọsọ ndụ ha mgbe ọbụla ha hụrụ ya,n’ihi na ọ na-eji ihe na-emerụ mmadụ ahụ mgbe ọbụla.   E kwukwara na ndị ọrụnchekwa Neighborhood Security Watch adịla na mbụ gbaa mbọ ka ha nwụchikọọ onyeara ahụ mana onweghị isi n’ihi na o kweghị ha njide.   Otu onye nọ ka ya bụnjinji jiri ma bụrụ onye achọghị ka a kpọọ aha ya kọwara na ka onye ọkada ahụkwụsịchara onye o bu ma na-achọ ka ọ pụọ, onye ara ahụ wakporo ya ma kụọ yaogbe osisi o ji n’isi nke mere ka ọ nwụọ.   Onye DivisionalPolice Officer (DPO) kpirikpiri Division, SP Chris Anyanwu, onye nke kwuputarana ya bụ ihe mere n’ezie dụrụ ndị otu na-anya

Nwoke amụnyela ụlọ ya na ụmụ ejima atọ ọkụ maka nde naira atọ goomenti wetere

CHINEDU Okpuru Mgboke gbara afọ iri anọ na ise etinyela ebe obibi ya dị n’Agbaja Unuhu Abakaliki, Steeti Ebonyi ọkụ ka ọ gbagbuo ụmụ ejima atọ Chineke ji gozie ya na nwunye ya. Nwoke ahụ ji ụmụ asatọ ka e kwuru na ihe bụ iwe ya bụ mgbagha dị n’etiti ya na nwunye ya banyere onye ga-ejide ihe karịrị nde naira atọ (N3million) goomentị Steeti Ebonyi nyere ha site na ngalaba na-ahụ maka ụmụnwaanyị (Ministry of Women Affairs and Social Development) ka a mụchara ụmụ ejima atọ ahụ. A mụrụ ụmụaka ahụ n’ụlọọgwụ Alex Ekwueme Federal University Teaching Hospital, Abakaliki, ebe a nọ wee kpọkue goomenti ka a gbapụta ha n’ụlọọgwụ. Otu onye bi n’ogbe ahụ aha ya bụ Maazị Okemini Isaac gwara ndị nta akụkọ na nsogbu dapụtara ụbọchị ahụ ka nwunye nwoke ahụ aha ya bụ Oriakụ Chinyere Okpuru gachara ụlọ ọbaego (bank) wee weta puku naira iri abụọ (N20 thousand) maka ileta ụmụaka. O kwuru na di ya gwara ya ka o nye ya ego site n’ego ahụ, nwaanyị ahụ nye ya. Ọ bụzi ka nwunye ya pụrụ ebe ọ gara ozi ka nwoke ahụ

E mechiela ụlọ ọlụ na-emepụta osikapa n’Abakaliki

Chinwendu Uzoatu   GỌỌMENTỊ Ebonyi Steeti emechiela ụlọ ọlụ na-arụpụta osikapa nke a maara aha ya bụ ‘Abakaliki Rice Mill’ oge a chọpụtara ihe na-egbu mmadụ ya na osikapa adigboroja. Onye kwuputara mmechi a e mechiri ụlọ ọlụ osikapa ahụ bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nye Gọvanọ David Umahi n’ihe gbasara nchekwa ime obodo, Dr Kenneth Ugbala ka a nọ na ‘State Executive Council Chambers’ n’obi gọọmentị dịka ọ na-agwa ndị nta akụkọ okwu gbasara ihe e metere na ya bụ nzụkọ ndị isi goomenti steeti ahụ. O kwuru si na  gọọmentị mere nkea n’ihi ama nke si n’aka ngalaba na-ahụ maka gburugburu ‘Ministry of Environment’ nke kwuru na osikapa adigboroja na nsị dị n’osikapa a na-eresi ndị mmadụ. Ọ gara n’ihu kwuo na a ga-emeghekwa ya ma e mechaa nnyocha ma kpọchapụ ihe ndị ahụ dị njọ.