Posts

Showing posts with the label ATMA

ATMA emeela ọgbakọ nkuzi maka ndị na-akwọ ụgbọala

A KPỌKUOLA ma dụọ ndị na-akwọ ụgbọala ka ha hie asaa n’anya, ọ kachasị n’oge mmemme ekeresimeesi a, iji belata ihe mberede, ọnwụ ike maọbụ ajọ ọdachi ndị ọzọ. Nke a bụ isi sekpụ ntị n’ọgbakọ nkuzi a chịkọbààra ndị na-akwọ ụgbọala na steeti Anambra, site n’aka ụlọ ọrụ steeti ahụ na-ahụ maka ije awele n’okporo ụzọ, bụ ụlọ ọrụ a maara dịka ‘Anambra Traffic Management Agency (ATMA). Ya bụ ọgbakọ nkuzi bụ nke weere ọnọdụ n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, ma bụrụkwa nke dọtara imirikiti ndị ọkwọ ụgbọala nakwà ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù n’ọchịchị steeti ahụ. Ka ọ na-agwa ọha mmadụ bịara ọgbakọ nkuzi ahụ okwu na ya bụ mmemme, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ dụrụ ụlọ ọrụ dị iche iche na-ahụ maka ije awele na itinye amụma iwu n’ọrụ ka ha jikọọ aka ọnụ, ọ kachasị ugbua a na-abanye na mmemme ekeresimeesi kpọnkwem. Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ Kọmishọna na-ahụ maka njem okporo ụzọ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Christian Mmadụbuko kpọkùrù ma dọọ ndị ọkwọ ụgbọala aka na n

Gọọmenti Anambra ebunyela ụlọ ọrụ ATMA na VIO akụrụngwa ọhụrụ

DỊKA a sị na ọ na-abụ a gwọọ ezigbo ajụ, ibu adị mfe, gọọmenti steeti Anambra ebunyela ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka ibelata agbakata akwụrụ n’okporo ụzọ, bụ ụlọ ọrụ “Anambra Traffic Management Agency (ATMA)” na ụlọ ọrụ nke na-ahụ maka nnyòcha ọnọdụ ụgbọala, bụ ụlọ ọrụ “Vehicle Inspection Officers (VIOs)” akụrụ ngwa ọhụụ pụrụ iche  eji ebelata ya bụ agbakata akwụrụ. Ya bụ akụrụngwa bụ nke a gbàrà n’anwụ n’isi ụlọ ọrụ oyibo steeti ahụ dị n’Awka, site n’aka kọmishọna steeti ahụ na-ahụ maka njèm okporo ụzọ bụ maazị  Uchenna Okafor mere ka a mara na ọ bụ ụlọ ọrụ abụọ ahụ ga-eji ya bụ akụrụngwa wee na-arụ ọrụ n’okporo ụzọ dị iche iche na ya bụ steeti, ma kwuo na ọ ga-enye aka ime ka ụgbọala kwụsị ikwòkọsị ọnụ n’okporo ụzọ.   N’okwu nke ya, onyeisi ụlọ ọrụ ATMA, bụ maazị Pat Obiefuna mere ka a mara na akụrụngwa ahụ ga na-enye aka n’ịgwa onye na-akwọ ụgbọala kwụsị, ma ọ bụ gàbá, ma sịkwa na onye ọbụla na-akwọ ụgbọala ga-ahunwu ya bụ akụrụngwa na-agbanyeghị ụdị oteaka ọ sọkwara ya nọrọ. Ọ dụkwazịrị

ATMA amalitela ime ka ohere dị n'okporo ụzọ dịgasị n'Onitsha

A DỤỌLA ndị na-akwọ ụgbọala na ndị na-azụ ahịa n’okporo ụzọ dị iche dị n’Ọnịtsha na okirikiri ebe ahụ ka ha kwụsị ịnọchisi ụzọ ebe ụgbọala na ndị mmadụ si aga, iji wee gbochie ihe nhịa ahụ ma ọ bụ ihe mberede okporo ụzọ. Onyeisi ụlọ ọlụ Anambra Traffic Management Agency, bụ Maazị Chris Ụzọechina nyere ndụmọdụ a ma dọọ aka na ntị a oge ya na ndị òtù ọlụ ya gara ọlụ ịchụsịsị ndị na-adọchi ụzọ na ime ka ohere dị n’okporo ụzọ dị iche iche dị n’Onịtsha na gburugburu ya. Ya bụ ọlụ bụ nke ha màlitèrè n’okporo ụzọ gara Owerri, buru ya gaa mpaghara Upper Iweka, wee pụta n’okporo ụzọ Oguta na mpaghara ebe ahụ e si abanye ime Ọchanja. Ọ sị na ebumnobi nke ahụ bụ iji wepụsịa ihe dị iche iche na-egbochi ụzọ, mee ka ụzọ na-aga siriri werere na steeti ahụ ma belatakwa ndapụta nke ihe mberede okporo ụzọ. Ọ kpọkuzịrị ndị dị iche iche na-etinye aka n’idochi okporo ụzọ ka onye ọbụla sepu aka na ya maka ọdịmma nke onye ahụ n’ihi na ndị òtù ahụ agaghị emekwara onye ọbụla a hụrụ na nke ahụ ebere, ma ya fọdụ

N’Anambra, ATMA ga-amalite ịkpụrụ ụgbọala adọchiri ụzọ

Izunna Okafor   E MEELA ka a mara na malite ugbu a dịrị gaba, na a ga na ịnwụchikọ ụgbọala ọbụla a dọbara  n’ebe ekwesighị ekwesi n’okporo ụzọ ọbụla na steeti Anambra. Onyeisi ụlọ ọrụ Anambra ‘Traffic Management Agency'(ATMA)  bụ Maazị Chris Ụzọechina mere ka a mara nke a dịka o mere ngagharị n’ụzọ awara awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha, I ji mara ka ọnọdụ agbakata a kwụrụ siri dị n’ụzọ ahụ. Ọ sịrị na ebumnobi nke a bụ iji wee bèlata ihe mberede okporo ụzọ, chụsịa ndị mmadụ na-anọchisi ụzọ ma mekwa ka éfè dị n’okporo ụzọ ọbụla, dịka ọ bụ otu n’ime ọchịchọ Gọvanọ Willie Obianọ. O mere ka a mara na ihe ndị ahụ so n’ihe na-ebutere ọtụtụ ndị mmadụ ihe mberede okporo ụzọ ma na-ewetakwa ọnwụ erughị eru nye ọtụtụ mmadụ, n’ihi na mgbe ụzọ chiere, ebe onye ụgbọala hụzịrị, o sukanye isi ya, na-agbanyegị ihe ọ ga-ewe. Ọ gakwara n’ihu kpọkuo ndị na-akwọ ụgbọala ka ha na-erubere ọkụ a gbakata a kwụrụ isi, ya na iwu ndị ọzọ na-achị okporo ụzọ, ma kwuo na onye ọbụla dara ya bụ iwu ga-enweta ntara