ASCSDA ekwela nkwà ịme ka ọtụtụ ime obodo soro keta ego ọrụ n'izuụka ọzọ
ỤLỌ ọrụ ‘Anambra State Community and Social Development Agency’, (ASCSDA) bụ ụlọ ọrụ mmepe ụlọ ọba ego mba ụwa na-enye nkwàdo na steeti Anambra ekwuola na ọ ga-amalitekwa ikesàkwùrù ụfọdụ ime obodo dị iche-iche na steeti ahụ ego iji kwàlite atụmatụ ọrụ mmepe malite n’ụbọchị Mọnde izuụka na-abịa abịa. Ọ bụ onyeisi ụlọ ọrụ ahụ, bụ maazị Chudi Mọjekwu kwupùtara nke a na mmemme inye ọzụzụ mkpụrụ ụbọchị abụọ, bụ nke a chịkọbààrà ndị a họpụtara isonyè n’òtù ọrụ dị iche-iche n’ịhazi ya bụ atụmatụ n’okpuru ọchịchị ndị ahụ a ga-ekesàra ego n’izuụka na-abịa abịa, nke gụnyere okpuru ọchịchị Awka South, Anambra East, Anambra West na Dunukọfịa. O mere ka a mara na ego ahụ bụ naanị maka ụmụ obere ọrụ mmepe dịgasị iche-iche, dịka ọ dị atụmatụ mmepe obodo ma ọ bụ atụmatụ mmepe òtù ahụ, bụ ‘Community Development Plans’ (CDPs) ma ọ bụ ‘Group Development Plans’ (GDPs) n’otu n’otu; ma gwakwa ha na a ga-enye ha akwụkwọ ozi ikike sitere ụlọ ọba ego mba ụwa ma ọzụzụ ahụ bịa na njedobe, iji nwe ike ide akwụkw