Posts

Showing posts with the label ASA-USA

Ụmụnwaanyị ASA-USA etinyela mmadụ 15 n'amụmà nchekwa ahụike Anambra

NGALABA ụmụnwaanyị nke otu ahụ jikọtara ụmụafọ steeti Anambra bi na mba ‘United States of America’ (ASA-USA) edebànyela aha mmadụ iri na ise na-arịa ọrịa kansà n’amụmà nlekọta ahụike steeti Anambra, bụ ‘Anambra State Health Insurance Scheme’, ka ha bụrụzie ndị ga na-anata ọgwụgwọ na nlekọta ahụike n’efù.   Mmadụ iri na ise ahụ bụ ndị a nọrọ n’ụlọ ezumezu ‘Obiofia Village Hall’ dị n’Amichi, n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi South’ nke steeti Anambra wee nye akwụkwọ ikike ha ga-eji na-anata ọgwụgwọ n’efu n’ụlọọgwụ na n’ogige nlekọta ahụike dị icheiche ha tinyere.   Ọ dị ncheta na ndị otu ahụ nọrọ n’ọnwa Disemba ahọ gara aga wee debànyekwa aha mmadụ iri ise na asaa ọzọ n’amụmà ahụ maka ịdị na-anata ọgwụgwọ n’efu.   N’okwu ya n’ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ihe na-emegasị na mba ofesi, ihe e ji aka emepụta, omenala na njem nlegharịanya, bụ Dọkịta Kenneth Anierobi kọwara ya bụ ọrụ ọma ndị òtù ahụ rụrụ dịka nke magburu onwe ya, ma bụrụkwa nke dabàrà adaba n’ọkpụkpọoku ‘Akụ Ruo Ụlọ’ ahụ ọchị