Posts

Showing posts with the label APSON

Ndị ‘Anti-Piracy Society of Nigeria’ anabatala ndị otu ha ọhụrụ

NDỊ  ANTI Piracy Society of Nigeria (APSON), ngalaba steeti Anambra anabatala ndị ọhụrụ karịrị otu narị na iri ise n’ọnụọgụ. Ọ bụ n’ụlọ ezumezu Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, Sports LightXtra na Homeland ka a nọrọ merube oke mmemme ahụ bụ nke a nọ na ya nye ụfọdụ mmadu onyinye nkwanye ugwu ‘award’. N’ozi ọ gụpụtara, Onyeisi Zuzugbe (Director General) APSON, Frank Uduonu kelere ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu gụnyere otu ndị uweojii, ndị na-ahụ maka njem okporoụzọ, otu ndị na-emepụta ihe n’ala anyị (Manufacturer’s Association of Nigeria), ngalaba steeti Anambra maka ịhụ na mbọ ịbuso agha nye  adigboroja bịara na mmezu. Ọ gara n’ihu kọwaa na adịgboroja bụ nke jọgburu onwe ya bụ nnọọ ihe a na-ahụta ebe niile. Ya mere, ọ rụtụrụ aka na site n’ịgbasa ozi ka ndị a  na-ekesara ihe ndị ahụ (consumers) mata banyere ọghọm dị na ha, na ọ ga-amịta ezi mmịmị, dịka a ga-agbasa ozi gazuo ebe niile. Onyeisioche mmem

Otu nkpochapu adigboroja, APSON ekeela ihe mgbochi korona n’Anambra

NDỊ otu Anti-Piracy society of Nigeria (APSON) ekesaarala ụmụAnambra ụfọdụ ihe ndị ahụ e ji egbochi ọrịa coronavirus. Ihe ndị ahụ ha kesara gunyere ihe e ji ekpuchi imi (nosemasks) di puku iri, ihe e ji akwọ aka (sanitizer) dikwa puku iri tinyere ihe ana-agba n’aka (gloves) di puku ise iji gwa ndị Anambra mkpa ọ dị mmadụ ịdị ọchamaka ịgbanarị ọrịa ọjọọ coronavirus. Ebe ndị ha gara kesaa ihe ndị ahụ gụnyere Eke Awka, NkwọEnugwu ukwu, Oye Agu Abagana, Afor Igwwe, Oye Olisa na Afọr Nkpọr. N’okwu ya nanjem ahụ, onye isioche zuzugbe (Director General). Otu ahụ bụ Frank Uduonu kwuru na ọ chọputara na o nwere ndịahụ n’ihi oke ọnụ ahịa nke a na-ere ha. Ya mere, APSON ji kpebie igbatara ndịmmadụ ọsọ enyemaka wee hụ na e chekwara ndụ mmadụ n’ebe ajọ ọrịa ahụ nọ. ọ rụtụrụ aka na dịka otu Anti-Piracy, abụghị nke gọọmenti nao kwenyere na inyere ụmụ mmadụ aka. Onyeisi APSON, ji ohere ahụ kpọkuo ndị Nigeria jiri biri kaha mee ihe ha kwesiri ime iji zọta ndụ ndị mmadụ. O kwuru sị; Ha ekwesịghị iche og