ANSPPB akụtuola ụlọ a rụrụ ebe iwu akwadoghị na Nkpor
Ọ NA-ABỤ onye a gwara agwa, ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ; maka na agadi nwaanyị kachie ntị wụfèé aja, e bute ozu ya n’ofete nke ọzọ. O wee bụrụ etu ahụ ka ụlọọrụ ‘Anambra State Physical Planning Board’ (ANSPPB) siri wee kụtuo ụlọ a rụrụ n’ebe iwu akwdòghị na Nkpọr dị n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra. N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ụlọọrụ ANSPPB, bụ Maazị Chike Mmadueke kọwara ya bụ ọrụ ịkụtu ụlọ ahụ dịka nke dabara adaba n’usoro iwu n’ihi na ya bụ ụlọ bụ nke a rụchiri n’ebe okporoụzọ siri gaa n’akụkụ ụlọ abụọ ọzọ, ma bụrụkwa ebe e si abanye n’okporo ụzọ ọzọ dịkwa n’akụkụ ebe ahụ, bụzị nke mere ka ọ na-esiri ndị bi na mpaghara ahụ ike ịbanye n’ụlọ ha, ma ya fọdụzie ịgafè n’ebe ahụ. Ọ kọwara na ebumnobi ụlọọrụ ahụ abụghị imegide maọbụ imekpà ụmụ mmadụ ahụ, kama na ọ bụrụ na ha akụtughị ụlọ dị etu ahụ ma leghàra ya anya, ị mara na ndị mmadụ ga na-arụzị ụlọ n’ebe ọbụla nà etu ọbụla ha chọrọ, bụ nke ọ kọwara dịka nke adabaghị adaba nà nke megidere ezi ebum