Posts

Showing posts with the label ANPC

N'Anambra, Kọmishọna Nwosu agaala njem mkpọtụrụ ụlọọrụ ANPC

KỌMISHỌNA ọhụrụ na-ahụ maka Mgbasaozi na steeti Anambra, bụ  Paul Nwosu awụchaala n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportslightXTRA na Homeland. Ọ bịara njem ahụ iji chọpụta etu ọrụ si aga ebe ahụ, ma marakwa ndị na-arụ ọrụ ebe ahụ.  Onyeisi ANPC, Sir Chuka Nnabuife na ndị ọrụ ya nabatara Kọmishọna ahụ nke ọma. Dịka ọ na-edugharị ya na ngalaba dị icheiche n’ụlọọrụ ahụ, Nnabuife mèrè ka ọ mara banyere mbọ niile ụlọọrụ ahụ na-agba, n’agbanyeghị ihe icheakamgba dị icheiche ha nwere; ma kpọkuo gọọment steeti nke Ọkammụta Soludo nọ n’isi ya ka ọ gbatara ha ọsọ enyemaka.  Ọ gara n’ihu kọwaa na kemgbe ọ malitere ọrụ dịka Onyeisi ANPC, na ha na Minịstrị na-ahụ maka mgbasaozi nọ n’ezi mmekọrịta, bụ ndị gọọmenti ga-esi n’aka ha haziere ha ọnọdụ.   Dịka o siri kwu, ihe ha chọrọ n’aka gọọment gụnyere inye aka mezie ụfọdụ akọrọngwa ndị e ji arụ ọrụ, mebiri emebi bụ ndị ụlọọrụ ahụ apụghị idozi; ma bụrụ ihe ndị ga

Ndị ndu ọhụrụ NUJ, Anambra akpọtụrụla onyeisi ANPC

. ..Hibe amụma ime afa Nnabuife ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ NDỊ ndu ọhụrụ a họpụtara ka ha kpara ụgbọ Nigeria Union of Jounalist  (NUJ), ngalaba steeti Anambra na-aga n’ihu nke Dọkịnta Odogwu Emeka Odogwu nọ n’isi ya awụchaala n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, Sports LightXTRA na Homeland, maka ụkpa ekele na oku ịkwado ha na-aga n’ihu.   Onyeisi ANPC, Sir Chuka Nnabuife na ndị ọrụ ya nabatara ha nkeọma.  N’okwu ya, Dọkịnta Odogwu gosipụtara afọ ojuju ya na ndị ọrụ ya nwere banyere nkwado ụlọọrụ ANPC nyere ha mgbe e mere nhọpụta ahụ nke ha ji turu ugo.  O kwuru sị na ọ dị ihe ise ha ji bagide njem ahụ. Ya mere o kwuru sị: “Anyị bịara ebe a taa ikele ụnụ otu ụnụ si nye anyị nkwado oge a họpụtara anyị, n’akpaghị oke ọbụla. Anyị na-akpọkwa oku ka ụnụ nọgide n’akwado ọchịchị ọhụrụ nke NUJ.”   Ọ gara nihu jaa Nnabuife ike maka ọrụ ọma ya n’ụlọọrụ ANPC nke gụnyere ihibe ọmarịcha ụlọọrụ ICT, agadaga ụlọezumez

Ndị ntorobia na-ede akwụkwọ n'Anambra akpọtụrụla ANPC, nye ha asambodo ekele

OTU jikọtara ndị ntorọbịa na-ede akwụkwọ na steeti Anambra a maara dịka ‘Society of Young Nigerian Writers (SYNW)’ ngalaba Anambra ebuterela ụlọọrụ ‘Anambra Newspapers And Printing Corporation (ANPC)’, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportslightXTRA na Homeland, na onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Sir Chuka Nnabuife ụkpa ekele maka nkwado dị ukwuu nke ha na-enye ha n’ịchịkọba mmemme ‘Chinua Achebe Literary Festival and Memorial Lecture’ kemgbe ọtụtụ afọ.   Ndị otu ahụ kwuputara ekele ahụ oge ha bịara njem mkpọtụrụ n’ogige isi ụlọọrụ ahụ nke dị n’Awka, hụ isi obodo steeti Anambra.   N’okwu ya na njem mkpọtụrụ ahụ, onyeisi otu ahụ, Maazị Izunna Okafor kwuru na ebumnobi njem ahụ bụ iji kelee Onyeisi ụlọọrụ ahụ nà ụlọọrụ ahụ n’onwe ya, maka nkwado ha na-enye ha oge niile iji na-achịkọba emume ahụ afọ ọbụla, ya na ịgwa ha na mmemme ahụ nke afọ a erukwaala, tinyekwara ịrịọ Onyeisi ụlọọrụ ahụ ka ọ bụrụ onye ga-enye nkuzi ‘Chinua Achebe Memorial Lecture’ n’emume nke afọ a.   O k

Ụmụakwụkwọ mgbasaozi UNIZK emeela njem nleta n'ANPC

ỤMỤAKWỤKWỌ na-agụ banyere mgbasaozi (Mass Communication), ogo nke abụọ na Nnamdị Azikiwe University, Awka (UNIZIK), abịala njem nleta n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation, Awka (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportslightXTRA. Ndịnkuzi ha mmadụ abụọ duru ha bịa njem ahụ ka ha gbaara anya ha ekeresimeesi.   Onyeisi ụlọọrụ ANPC, Sir Chuka Nnabuife na ndị ọrụ ya gụnyere Editọ bụ Rose Oranye nabatara ha nke ọma ma mee ka ha ghọta tụpụ na gbalaga dị n’ọrụ mgbasaozi.   N’okwu ya, Nnabuife kelere ha maka ịbagide njem ahụ. O mere ka ha mata banyere ọtụtụ usoro a na-agbaso tupu e bipụta akwụkwọ akụkọ. O kwuru sị: ‘Ụlọọrụ a na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa nke bụ akwụkwọ akụkọ a na-ede n’asụsụ Igbo. Sọọsọ ụlọọrụ a bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ n’asụsụ Igbo. Ụfọdụ amalitele ibopụta nke ha na-etinye n’ime akwụkwọ ha ma ka ọ dị ugbua, anyị bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ Igbo. Akwụkwọ akụkọ ọzọ anyị na-ebipụta bụ akụkọ egwuregwu,

ANPC etoola Chineke maka ọgbụgba afọ iri ise Editọ ha, Oriakụ Oranye

Image
NDỊ ọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLightXtra etoola Editọ ha, Oriakụ Rose Oranye dịka ọ gbara afọ iri ise na ndụ.   Emume ahụ nke were ọnọdụ na ngalaba akụkọ (Editorial Department) kpọtụrụ akpọtụ ma bụrụ ihe oke ọńụ.   N’okwu ya na mmemme ahụ, onyeisi (MD/CEO) ANPC bụ Maazị Chuka Nnabuife gọrọ ọfọ ihe ọma n’isi Oriakụ Oranye. Ọ kpọkuru Chineke ka o nye ya ndụ n’uju, ma na-aga n’ihu n’ọrụ ya tinyere iweta ihe ọma n’ezinaụlọ ya.   Nnabuife gara n’ihu kwuo sị: “Ihe ị ga-eri agaghị akọ gị. Ị ga-ewelatara ezinaụlọ gị ihe ọma ma nwetakwa ihe ọma site n’aka ha. Ọrụ gị ga na-aga n’ihu, ị g ana-enweta mbuli elu.”   Ọ rụtụkwara aka n’ọrụ ọma ya, nke ọ na-ezipụta n’ụzọ dị iche iche, ma dụkwaa ndị mmadụ ọdụ ka ha mụta ka e si arụ ezi ọrụ, dịka ọ kwuru na ọ bụghị onye ọbụla ga-emeli ihe Editọ Oranye na-eme.   N’akụkụ nke ya, Oriakụ Uchenwa Mba bụ otu n’ime ndịọrụ ANPC toro ya maka mbọ ya na ọrụ ọma ya niil

Ndị ntaakụkọ ANPC ahọpụtala ndị ọchịchị ọhụrụ

ONYEISIOCHE otu jikọtara ndị ntaakụkọ (Nigeria Union of Journalist) na steeti Anambra, Emmanuel Ifesinachi na odeakwụkwọ bụ Emmanuel Udeagha akpọkula ndịisi ọchịchị (new executives) a hopụtara n’Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Di Taa na Sportslightxtra ka ha kee aji n’ume ma na-arụsị ọrụ ike dịka o kwesịrị.   Ifesinachi nyere Chineke ekele maka onyinye nke ndụ ma kọwaa na National Light so na’ide ji NUJ, na steeti Anambra.   Ọ gwara ndi ahụ a họputara ọchịchị si: “A hanyela ụnụ n’aka ịhụ na ngalaba NUJ a bụ National Light na-aga ma na-eme nke ọma dịka o kwesịrị, ụnụ ga na-esonye n’ọgbakọ anyị niile ma na-ahazikwa ọgbakọ nke unu. E wepụ ihe gbasara ọgbakọ nke otu anyị, ndị a a họputara ọhụrụ ga-agba mbọ hụ na ndị NUJ na-amịputa ezi mmimi n’ọru. Achọrọ m ka ụnụ si otu a hụta ya, ma si otu ahụ na-eme ka ụlọọrụ a si n’ike na-aba n’ike.”   Otu o sila dị, ọ kpọkuru ndị ntaakụkọ ka ha hie asaa n’anya, ma na-ekwu ez

Ụbọchị ụmụaka: Ụmụakwụkwọ Vivy Kids School, Awka, emeela njem nleta n'ụlọọrụ ANPC

ỤBỌCHỊ ụmụaka nke e mere n’izuụka gara aga, ma bụrụ nke a na-eme afọ ọbụla dịka otu mba ụwa siri hazi ya, gara dịka o kwesịrị. Ọ bụ oke ụbọchị maka ụmụaka. Ya mere, nnukwu emume ahụ dara ụda n’ụwa niile, nke steeti niile dị n’ala Nigeria sonyere na ya. Ụlọakwụkwọ dị iche kpọrọ ụmụakwụkwọ ha ga njem nleta n’ebe dị iche iche, ebe ha nọrọ legharịa anya ma mụta ihe dị iche maka na Igbo kwuru okwu sị na anọghị otu ebe ekiri mmọnwụ. N’otu aka ahụ, ụmụakwụkwọ Vivy Kids School, Awka, wụchara n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLightXTRA, maka mmụta na nlere anya. Ha dị ndị nkuzi abụọ na ụmụakwụkwọ iri atọ chapụrụ achapụ were bịa. Onyeisi ngalaba azụmahịa (advertorial), Oriakụ Ngozi Agusiobo, n’aha Onyeisi (MD/CEO) ụlọọrụ ANPC, Chiifu Chuka Nnabuife, nabatara ha nke ọma tinyere ndị ọrụ ANPC ndị ọzọ. O kelere ha maka njem ha bịara ma nyekwa aka ime ka ha mụta ihe dịka o kwesịrị. Emeka Chiaghanam,

Onyeisi ọhụrụ NIMC akpọtụrụla ANPC

ONYEISI ọhụrụ nke National Identification Mandatory Commission (NIMC) steeti Anambra bụ Iwuchukwu Philip Okeke kpọtụụrụ ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-emepụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra.   Iwuchukwu, onye nke malitere ọrụ dịka onye nlekota NIMC na steeti Anambra ka ọnwa Jenụwarị dị n’abalị iri abụọ na asatọ n’afọ a bụ 2021 ma bụrụkwa onye nọbu n’isi ụlọọrụ ha n’Abuja  bụ onye Anam nke dị n’okpuru ọchịchị Anambra West na steeti Anambra.   N’ajụjụ ọnụ ndị ntaakụkọ anyị gbara ya, ọ kọwara na ya malitere ọrụ a na steeti Anambra oge onye ọbụla na-achọ inweta akara NIN. Ya mere o kwuru sị: “Anọ m n’elu ya kemgbe m malitere ọrụ a na steeti Anambra. Ana m agbasi mbọ ike ịhụ na onye steeti a chọrọ inweta akara NIN nwetara ya. Ọ dịghị mfe dịka mmadụ niile chọrọ inweta ya n’otu oge.”   Ọ gara n’ihu kọwaa na iji were hụ na ọ bụ ihe e kwuru ka a na-eme, na ya kpọtụụrụ okpuru ọchịchị dị ga na steeti Anambra ebe ya mere ka

N'Anambra, ndị omenka emegheela ihe ngosi nke 2020

Image
… Gosikwa na ọ bụ enweghị mmụta butere enweghị ezi nchekwa obodo OTU jikọtara ndị ọkwanka n’ala anyị bụ The Society of Nigerian Artists, ngalaba Steeti Anambra wụchara n.ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) ụnyaahụ maka igosipụta nka ha kwara (art exhibition) nke isiokwu ya bụ: Nchekwa.   Ọgbakọ ahụ gara nke ọma, ọtụtụ ndị mmadụ si ebe dị iche iche bịa bụ ndị gụnyere ndị ọnụ ruru n’okwu n’obodo, ndịntaakụkọ w.d.g. Ha gosipụtara aka ọrụ ha n’ụzọ dị egwu nke gosịrị n’ezie na ihe a mụrụ amụ ka ihe a gwọrọ agwọ.Ihe ndị ha gosịpụtara gụnyere,ihe osise, ihe ọkpụkpụ,akwa e sijiri esiji w.d.g.   N’okwu ya n’ihe ngosi ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ihe metụtara nka (Commissioner for Indigeanous Art Work, Diaspora Affairs and Culture and Tourism), Dọkịnta Christian Mmadubuko onye nke Odeakwụkwọ Ọkpụtọrọkpọ Maazị Emmanuel Umeokana nọchitere anya ya kwuputara mkpebi ministrị ahụ banyere ịkwadosi otu ahụ oke. O kwuru na kemgbe 2017 ka ha bidoro kpaba ike n’ebe ndị otu ahụ nọ. O gos

Otu Hult Prize Foundation arịọla enyemaka ANPC maka a ọmpi atụmatụ ọrụ ụmụ akwụkwọ

 IGBO sị na ọ na-abụ ọkọ kọba mmadụ, o jekwuru ibe ya, mana ọ kọba anụmanụ, ọ chọba ukwu osisi.   Ka ọ dị taa, ụmụakwụkwọ na-ahazi asọmpi ‘Hult Prize’ na mahadum Nnamdị Azikiwe (Unizik) dị n’Awka, n’ime steeti Anambra akpọtụrụla ụlọọrụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC)’ ma rịọ njikọaka ya n’ịgbasa ozi banyere asọmpi ahụ nke ahọ a.   Onyeisi òtù nhazi asọmpi ahụ a maara dịka ‘Hult Prize Foundation’ na mahadum UNIZIK, bụ Maazị Ava Somtoochukwu bụ ya kwupụtara nke a oge ọ bịara kpọtụrụ onyeisi ANPC ahụ bụ Maazị Chuka Nnabuife n’isi ụlọọrụ ahụ dị n’Awka.   O mere ka a mara na asọmpi ahụ bụ nke ga-ewere ọnọdụ ụbọchị Satọdee izuụka a n’ogige ‘Chike Okoli Centre for Entrepreneurship Studies’ dị n’ime mahadum ahụ, ma mee ka a mara na ya bụ asọmpi bụ maka ụmụakwụkwọ mahadum UNIZIK, ma kwuo na ndị tuuru ugo na ya ga-agbago n’ogoogo nke mpaghara ndịda ọwụwa anwanyụ.   Ọ sị na asọmpi ahụ bụ asọmpi ụmụakwụkwọ n’ogoogo mba ụwa, nke ọ bụ onye chịrị mba US n’oge mbụ, bụ Bill Clinton

Otu ndịntorobịa na-ede edemede etoola ANPC

OTU jikọtara ndịntorobịa na-ede edemede n’ala anyị, The Society of Young Nigerian Writers (SYNW) ngalaba steeti Anambra awụchaala n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra dịka ha na-akwadebe emume ome n’afọ ha ji echeta Chinua Achebe bụ ọka ibe n’edemede, onye nke ha na-elegara nzọ ụkwụ ya anya dịka nna ha n’edemede. Ndị otu SYNW na-eme nnukwu emume a ma ọnwa Novemba gbaa abalị iri na isii n’afọ ọbụla, bụ ụbọchị ncheta ọmụmụ Achebe. Odeakwụkwọ otu ahụ n’ala Nigeria gbaa gburugburu ma bụrụkwa onyeisi na ngalaba steeti Anambra bụ Izunna Okafor onye duru ndị otu ya bịa njem ahụ kelere onyeisi (MD/CEO) ụlọọrụ ahụ bụ Sir Chuka Nnabuife maka ezi nnabata na nkwado ya n’ebe otu ahụ nọ. O kwuru sị: “Anyị malitere ime emume nke anyị kpọrọ Chinua Achebe Literary Festival afọ ise gara aga iji wee na-echeta Chinua Achebe, onye Ogidi nke nwụrụ ka ọnwa Maachị dị n’abalị iri abụọ na otu n’afọ 2013. Ebum

E liela onye ntaakụkọ, Grace Nnadozie n'Awka

IHE niile gara n’udo na Fraidee gara aga, ọnwa Oktoba dịn’abali iteghete n’afọ a bụ 2020, dịka e liri ma mee emume akwamozu nke otuonyeọrụ National Light bụ Grace Nnadozie.   Ọ bụ n’Umuike Awkan’okpuru ọchịchị Awka South ka a nọrọ wee mee akwamozu ahụ.   Grace Nnadozie larammụọ, onye rụrụ ọrụ n’ụzọ dị iche iche dịka onye ntaakụkọ n’Anambra Newspapersand Printing Corporation (ANPC), Awka bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ NationalLight, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra nwụrụ ka ọ rịachara ọrịa obere oge.   N’ozi iti aka n’obi ọgwara ndị ezinaụlọ ahụ n’oge emume ahụ, kọmịshọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụzịrịọha na eze ihe ha kwesịrị ịma (Commissioner for Information and PublicEnlightenment) C. Don Adinuba kọwara ọnwụ ya dịka ihe nwute n’ebe ndị ọrụ ntaakụkọnọ, ọ kachasị ndị NUJ, ngalaba steeti Anambra ebe ya bụ onye lara mmụọ tụnyekarịrịụtụ ya na mgbasaozi.   Adinuba gara n’ihu kọwaana dịka ya malitere ọrụ na ya matara ya nke mere na ọnwụ ya metụtara ya n’ụzọ pụrụiche ma kpọkuo ọha na eze k

Ụlọọrụ tekninụzụ agba ọhụrụ achọọla mmekọrịta ya na National Light

GREAT Phones Enterprise, bụ ụlọọrụ teknọlọjii dị na Nnewiewepụtala akwụkwọ ọhụrụ ọ kpọrọ Afro Emoticons Colour Book maka ụmụaka na ọtụtụakọrọngwa ’emoticons’ iji nyere mgbasaozi aka.   Onye mere ka nke ahụpụta ihe bụ onye hibere otu ahụ Uchenna Nzewi, na mkparịtaụka ya na onyeisi ụlọọrụAnambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC) bụ Sir Chuka Nnabuife na ndịntaakụkọ National Light, mgbe ọ kpọtụụrụ ụlọọrụ ahụ.   Dịka o siri kwu, hamalitere ya bụ njem n’afọ 2014, na ha agbaala mbọ dị iche iche iji kwalitemgbasaozi n’Africa. Ọ rụtụrụ aka na ọ gbatara ya n’uche na mmalite afọ a,iwebata ụdịrị ’emoticons’ ọhụrụ, nke mere ya jiri wepụta akwụkwọ ‘colouringbook’ maka ụmụaka, nke na-egosipụta ’emoticons’ Africa.   Nzewi kọwara na akwụkwọahụ ka bụ obere ihe n’ihe ndị ụlọọrụ ahụ kwadoro maka ụmụ na-eto eto, dịka a kaga-achịkọba ‘Tech book camps’ tinyere onyoonyoo ‘educational video games’.   Ọ gara n’ihu kwuo naihe iche aka mgba ụlọọrụ ahụ nwere kachanụ bụ nsogbu korona nke mere na ọ dịghịzị

Ndị isi NUPPPPROW emeela njem nleta n’ANPC

… Ndị isi, Obiano maka imeta ndịọrụ nkeọma A KỌWAALA steeti Anambra dịka obodo na-atọ ezi ụkpụrụ nke ndịọzọ na-elegara anya, n’ihe gbasara mgbasaozi, ọdịmma ndị ọrụ na ịrụpụta ezi ọrụ.   Onyeisioche otuNational Union of Printing, Publishing and Paper Products Workers (NUPPPPROW)n’ala anyị, Comrade John Ushie kwuputara nke a n’Awka, isiobodo Anambra oge odu ụfọdụ ndị otu ahụ wee wụchaa n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and PrintingCorporation (ANPC).   N’okwu ya na mmemmeahụ, o kelere Gọvanọ Willie Obiano maka imeta ndị ọrụ nke ọma tinyere mbọ ya n’ịkwụchapuụgwọ niile ruuru ndị lara ezumike nka n’ọrụ na steeti ahụ; ma kelekwaa ndịisiANPC n’ihi ime nke ọma maka ọdị mma ndị ọrụ.   Dịka ọ na-akọwapụtamkpa ezi mmekọrịta dị n’etiti ndịisi maka imepụta ihe n’ụlọọrụ ọbụla, onyeisiNUPPPPROW ahụ, onye nke e dugharịrị n’ogige ANPC gosịrị afọ ojuju banyere ọnọdụụlọọrụ ahụ na ezi mmekọrịta dị n’etiti ndịisi na ndịọrụ ma kpọọ oku ka ọ dịrịotu ahụ na-aga n’ihu.   Banyere ihe o ji bịanjem ahụ, o kwuru sị: “

ADS akpọkuola ndị Anambra ka ha kwado Soludo

NDỊ otu a kpọrọ Anambra Demands Soludo (ADS) wụchara n’ụlọọrụAnambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọakụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra na Tuzdee, wee kwupụtaebumnobi ha nke ha chọrọ ka a mata.   Isiokwu ha bụ na hana-agba mbọ ka Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo bụ nwaafọ Anambra jibu ọkwa dịkaonyeisi (governor) ụlọọbaego ala anyị, Central Bank of Nigeria pụta maka ịchịsteeti Anambra, ka ọ bụrụ ya ga-anọchị anya Chief Willie Obiano.   Onye ndu otu ahụ bụJude Emecheta kwuru sị na ha bịara ka ANPC gbasaa ozi ha ka ọha nụrụ ya. Okwuru sị: “Anyị bịara ka anyị kpọkuo ndị Anambra ka ha họpụta ezigbo mmadụga-anọchi anya Obiano, n’agbanyeghị otu ndọrọndọrọ ọchịchị onye nọ. Obianoakpaala ike dị egwu na steeti Anambra, ya mere anyị na-achọ onye ọzọ ga-eme karịa.Soludo bụ odogwu. Onye ọbụla maara ike ọ kpara na ihe gbasara ụlọọbaego.”   Emecheta kọwara na ọbụ site na ntụziaka Soludo n’oge ọchịchị Olusegun Obasanjo ka e ji wee chekwaaak

Ikwu na ibe ekeleela Chineke ka Nnabuife gbara afọ ọhụrụ

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and PrintingCorporation (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taana Sportslight Xtra dịka onyeisi (Managing Director/Chief Executive Officer)Sir Chuka Nnabuife mere emume ọgbụgba afọ ya.   Emume ahụ kpọkọtara ọtụtụndị mmadụ sị n’ugwu na ndịda wee bịa soro ya ńụrịa n’ihi ngozi Chineke n’ebe ọnọ.   Sir Nnabuife, onyegbara afọ iri ise na abụọ (52) kelere Chineke maka ndụ na afọ ọma ya ma kpọkuondị mmadụ ka ha na-enye Chineke ekele oge niile.   O kwuru sị: “Ụfọdụ mmadụka anyị ike ma ha ahụghị ihu anyanwụ. Ọbịbịa m bịara ebe a bụ ngọzị, dịka mrugoro ọrụ na mpaghara South West ma rụkwaa ọrụ ntaakụkọ ọtụtụ afọ. Ọtụtụ ndịmmadụ kwuru na ebe a bụ ebe a gbahapụrụ agbahapụ ma kwuo ụdịrị okwu na-ajụ obioyi ma ana m eto Chineke taa maka ịnọnyere anyị.”   Odeakwụkwọ otu ndịntaakụkọ (NUJ) ngalaba steeti Anambra bụ Emma Udeagha toro Nnabuife maka mbọ yama rịọ Chineke ka o nyewanye ya amamihe iji na-aga n’ihu.   Onye enyemaka pụrụich

Dọkịnta Ifeanyi emeela ọgbụgba afọ ya n'ụlọọrụ ANPC

NdỊ Igbo kwuru okwu sị na oriri abụghị ọnụ nkahie, na onweghịonye e tinyere nnu n’ọnụ ọ gbụpu ya makana anya na ihe dị mma gbara akwụkwọ. Yamere, oriri na ọṅụṅụ rịrị ibe ya elu n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and PrintingCorporation (ANPC), bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taana SportsLight Extra; na Tuzdee dịka Dọkịnta Paul Ifeanyi, onye enyemaka pụrụiche gọvanọ (SSA) n’ihe gbasara agụmakwụkwọ sekọndịrị wụchara maka emume ọgbụgbaafọ ya.   Onyeisi ANPC(MD/CEO) bụ Sir Chuka Nnabuife ji obi aṅụrị wee nabata ya wee kwuo sị: “DọkịntaIfeanyi bụ otu n’ime anyị. Obi dị anyị ụtọ na taa bụ ụbọchị ọ na-echeta ọmụmụya. O wee bụrụ na ya na onye nke anyị, Chief Patrick Ugbaja onyeisi ASUBEB;onye nke ọ bụghị sọ na ọ gụkwuru akwụkwọ na Abbot Boys Ihialla, kama na ọ bụbuonyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, sokwu wee bịa. Ọ na-eme mma n’ASUBEB. Anyị na-asị ụnụnnọọ.”   N’okwu nke ya,Ugbaja kọwara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị ọma. O kelere Nnabuife na ndị ọrụ ANPCmaka ezi mmekọrịta. O kwuru sị: “Daalụnụ,

Onye ntaakụkọ na-efu efu: Awba Ofemili akpọọla oku enyemaka

NDỊ Awba Ofemili nke dị n’okpuru ọchịchị Awka North akpọtụrụlaụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC),bụ ndị na-ebipụta akwụkwọakụkọ National Light, Ka Ọ dị Taa na Sportslight Extra , wee nye mkpesa naMatthew Onwuasoanya na-arụ ọrụ n’ụlọọrụ ahụ ma bụrụ onye obodo ha na-efu efu.   N’ozi ahụ nkeonyeisi zuzugbe (President General) Awba Ofemili Development Union bụ DọkịntaIkechukwu Offorkansi na ode akwụkwọ otu ahụ bụ Maazị Victor Okoye tinyere akana ya, ha kpọkuru ụlọọrụ ahụ ka ha lebaa anya nke ọma n’okwu ahụ iji chọpụta ụzọmmiri siri baa opi ụgbọgụrụ na ntọrọ nke a tọọrọ Matthew Onwuasoanya n’ebeobibi ya dị na Ngodo Nise n’okpuru ọchịchị Awka South, ka ọnwa Mee dị n’abalịiri atọ n’afọ a bụ 2020.   N’okwu ọ gwara ndịntaakụkọ n’ụlọọrụ ahụ, Ofoorkansi kwuru sị: “Matthew bụ onye Awba Ofrmili.A tọọrọ ya n’ebe o bi na Ngodo Nise, n’okpuru ọchịchị Awka South ka ọnwa Mee dịn’abalị iri atọ. Ọ na-emụtụta anyị dịka obodo, ọ dị mkpa ka anyị na gọọmenti ọna-arụrụ ọrụ jikọọ aka ọnụ.

NAUS, ngalaba Anambra ehibela ndị ọchịchị ọhụrụ

NDỊISI ọchịchị nke National Association of UniversityStudents (NAUS) ngaiaba steeti Anambra eduola ndị ọchịchị ọhụrụ n’iyi ọrụ nansonso a. Emume ahụ nke a nọrọ n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and PrintingCorporation (ANPC) bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taana SportsLight Xtra mee kpọkọtara ụmụakwụkwọ si ụlọakwụkwọ dị iche iche nasteeti Anambra dịka National Open Univerity Abagana, Nnamdi Azikiwe University,Awka, Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University, Igbariam na Uli Campus, TansianUniversity, St Paul’s University, Awka w.d.g.   Ode akwụkwọ otu ahụbụ Steve Okpalobi kwuru na nkwado nke gọọmenti steeti Anambra nke Gọvanọ WillieObiano nọ n’isi ya na-enye ANPC abụrụla ihe ọkpụtọrọkpụ. Ọ rụtụrụ aka na ụlọọrụahụ na-ebipụta akwụkwọ akụkọ dịbu ka ebe a gbahapụrụ agbahapụ mana kemgbeonyeisi nọ ugbu a Sir Chuka Nnabuife banyere n’ọrụ, ọ bụzi ebe e ji ama atụ nkemere na a na-emezi ọtụtụ mmemme na ya n’ihi na ihe dị mma na anya gbara akwụkwọ.   O kerele onyeisi ụlọọrụahụ (ANPC

Emume karol Ekeresimesi dara ụda n'ụlọọrụ ANPC

Image
OKE ọńụ dara n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra dịka ha nọ na Tuzdee mee emume abụ ọńụ nke Ekeresimesi (Christmas Carol). Emume ahụ kpọtụrụ akpọtụ, ụmụaka tinyere ụmụakwụkwọ si n’ụlọakwụkwọ dị iche iche na ndị okenye si n’elu na ala daa ka igurube n’ụlọ ezumezu ANPC. A bụrụ abụ ma guo ihe ọgụgụ iteghete sị n’akwụkwọ nsọ, ụmụakwụkwọ mere ihe ngosi dị iche iche ebe ndị otu National Light Art House mere ejiri mara ha iji mee ndị mmadụ obi ụtọ. Emekwara asọmpi edemede, tinyekwara itụ okwe ‘scrabble’ w.d.g. N’okwu mmalite ya, onyeisi (MD/CEO) nke ụlọọrụ ahụ bụ ‘Sir’ Chuka Nnabuife sị na ukwe karol Ekeremesi bụ ihe a dị mbụ eme mana ndị ANPC na-akpachapụ anya ihụ na nke ha bụ ọpụrụiche. O kwuru sị; “N’afọ a, anyị chọrọ ime ihe pụrụ iche maka ụmụaka na ndị ntorobịa. Ya mere anyị gbalịrị ịkpọta ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị n’Awka”. Nnabuife kọwara sị na n’ihe ngosi dị iche iche otu National Light Art House