ACORA akaala ụka owuwe ihe ubi na ịtụ mmamma
Ọ NA-ADỊ mma mmadụ gụrụ gụrụ gụrụ, o kelee ihe na-ejere ya ozi na ihe ọ na-ejere ozi. N’ịgbasò nke a, ndị ụka ‘Anglican Church of Redemption’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra nọrọ ụbọchị ụka gara aga wee jiri ọñụ na ite egwu ọñụ wee bịa n’ihu Chineke ịtụrụ Ya mmamma maka onyinye ndụ, ezi ahụike na ihe ndị ọzọ o jirii gọzie ha. Ya bụ ụka owuwe ihe ubi bụ mmemme omenafọ ụlọụka ahụ na-eme, ma bụrụkwa nke ha ji achịkọta ụka ịtụ mmamma ndị ọzọ dịkwa ka ya a na-eme n’afọ ọbụla. N’okwuchukwu ya n’ofufenro ahụ nke afọ a, nke isiokwu ya bụ ‘Iwuru Chineke’ (Building for the Lord) Ụkọchukwu Paul Umeokoli, nke ụlọụka St. Thomas Anglican Church, Ebenebe, onye bụkwa Ashdikin nke Awba-Ofemili Ashdikinri, kọwàrà iwuru Chineke ụlọ dịka nnukwu ohere ọma, nke na ọ bụghị onye ọbụla nwèrè ya; ma dụọ ndị ụka ka ha jiri ya bụ oh ere kpọrọ ihe oge ọbụla ọ bịara ha. Ka ọ na-akọwa mkpa ọ dị mmadụ inye Chineke ekele oge niile màkà mmesoọma ya niile, nchekwa ya na ngọzi Ya n’ime oge ọjọọ a agụụ na nk