Ụmụnwaanyị akpọkuola onyeisiala ka ọ kwàlite ọnọdụ nchekwa
A KPỌKUOLA onyeisiala Nigeria bụ Muhammadu Buhari ka o welitekwuo aka n’ọrụ na mbọ ahụ a na-agba imemilà ajọ ọnọdụ nchekwa na-arịzị ibe ya elu n’ala Nigeria ugbua, ma dụọ ya ọdụ ka o weghàchite ezi ọnọdụ nchekwa n’ala Nigeria, site n’ime ka nchekwa bụrụ ihe mbụ ọ na-elebara anya n’ọchịchị ya. Ụmụnwaanyị ụka Angịlịkan na dayọsiisi Awka bụ ha kpọrọ òkù a na nnukwu mmemme ha chịkọbara na nsonso a, a maara dịka ‘Anglican Diocesan Women Conference (ADWOC)’ nke ahọ 2021. Mmemme ahụ isiokwu ya bụ ‘Aha Jehova Bụ Ebe Ụlọelu Dị Ukwu’ bụ àgbà nke iri atọ na ise, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’ụlọụka ‘St. Mark’s Church, Aguluzigbo’ dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Anaocha nke steeti Anambra. N’ozi pụrụ iche ọ gụpụtàrà na mmemme ahụ, onyeisi otu jikọtara ụmụnwaanyị, ndị nne na ụmụagbọghọ na mpaghara Naịjà, bụ Oriakụ Martha Chioma Ibezim katọrọ etu ndị Fulani na-achị ehi si enye nsogbu, na-egbusi mmadụ, ma na-emekwa mkpamkpa na mpaghara ebe dị iche iche n’ala Nigeria ugbua, ma kọwaa ya dịka isi sekpụ