Onye ọrụ nchekwa adakpola nwata akwụkwọ n'ogige ụlọakwụkwọ
NDỊ uweojii kọmandị steeti Enugu anwụchikọọla onye ọrụ nchekwa gbara afọ iri asaa na ise dakporo nwata nwaanyị gbara afọ iri na otu n’ogige ụlọakwụkwọ. Onye uweojii na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii na kọmandị ahụ bụ SP Ebere Amaraizu kwuru na otu ezigbo mmadụ jidere nwoke ahụ chịị mgbe ọ na-akpa arụ ahụ. Amarizu kọwara na nwoke ahụ nọ n’otu ụlọ dị n’ogige ụlọakwụkwọ Community Secondary School, Ugbaike nke dị n’okpuru ọchịchị Igbaeze wee kpaa arụ ahụ. O kwuru sị;“Dịka e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na njọ mmadụ ga-arapụta ya, arụrụala nke nwoke ahụ agbaala ya na anwụ. Nwoke ahụ maka ịdakpo nwa nwaanyị gbara afọ iri na otu. A chọpụtara na ya bụ ihe mere n’otu ụlọ na Community Secondary School, Ugbaike.” Onye okwuputa okwu ndị uweojii ahụ kwukwara na nwoke ahụ na-arịọ mgbaghara sị na ọ bụ ekwensu tinyere ya n’ịkpa arụ ahụ. N’ikpeazu, o kwuru sị, “Nwoke ahụ na-enyeziri ndị uweojii aka n’ime nnyocha.”