Otu onye nwụrụ mgbe mmanwụ wakpòrò ụlọụka alakụba n'Osun
ỤLAGA sị na ọ bụrụ na ya apịaghị ụtarị, ụmụaka anaghị ama na ọ bụ mmanwụ. N’ịgbaso nke a, mmanwụ nọrọ na nsonso a wee wakpo ndị okpukperechi ụka alakụba (bụ ndị Muslim) ebe ha nọ n’ụlọụka n’Osogbo bụ isi obodo steeti Osun ụbọchị ụka gara aga, gbuo mmadụ ma bibisiekwa ọtụtụ ihe n’ebe ahụ. Mwakpò ahụ bụ nke weere ọnọdụ n’ụlọụka alakụba ‘Kamorudeen Central Mosque’ dị na Oluode Aranyin, n’Osogbo, ma bụrụkwa nke malitere oge o jiri ọkara gata elekere abụọ nke ehihie ụbọchị ụka ahụ oge ndị alakụba ahụ nọ n’ụlọụka ahụ wee na-ekpe ekpere maka ọnọdụ ala Nigeria. Dịka akụkọ siri kọọ, otu onye nwụrụ, ebe mmadụ ruru iri na abụọ n’ọnụọgụgụ, nke gụnyere ụfọdụ ụmụaka erubeghị ahọ iri na asaa, nwetere mmerụahụ site na mgbọ égbè a gbara n’ebe ahụ oge ya bụ nsogbu dapụtara; ma bụrụkwazie ndị nọ n’ụlọọgwụ dị iche iche ugbua anara ọgwụgwọ. Otu nwata nwoke gbara ahọ iri na abụọ, bụ Abduljeleel Ali nwètèrè àpà mgbọ égbè n’obi; nwata nwoke ọzọ, bụ Adebayo Awolesin gbara ahọ iri na ise nwètèkwàrà àpà