Isi ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ Nigeria ebunyela Anambra ụgbọ ngbanyụ ọkụ abụọ
ISI ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ ala Nigeria a maara dịka ‘Feredal FireService’ nọrọ na n’ọdịnso a wee bunye ngalaba ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ ahụ na steetiAnambra ọmarịcha ụgbọala nsọnyụ ọkụ ọhụụ abụọ, iji kwalite ọrụ na mpaghara ebedị iche iche n’ime steeti ahụ. Mmemme ịnabàtà ụgbọalaahụ bụ nke weere ọnọdụ n’isi ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ ahụ dị n’Awka bụ isi obodosteeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara aka na-achị steeti ahụ, b Gọvanọ WillieObianọ, nke ọ bụ osote ya bụ Dọkịta Nkem Okeke nọchitere anya ya. N’okwu ya na mmemmeahụ, Gọvanọ Obianọ kelèrè isi ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ ala Nigeria maka onyinye nkwàdona mgbata ọsọ ahụ, bụkwa nke ọ gbara akaebe na ọ ga-enye aka n’ụzọ pụrụ iche n’ịkwàliteọrụ nsọnyụ ọkụ na steeti ahụ. O mèrè ka a mara na ọchịchịya ga-aga n’ihu ịkwàdo ụlọọrụ ahụ na steeti ahụ iji hụ na e nwere ezi nchekwandụ na ngwongwo ụmụafọ steeti ahụ pụọ na mbíbì nke ọkụ ọgbụgba, ma gosipụtakwaolileanya o nwèrè na ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ ka ga-agakwa n’ihu na-enwetawanyeúrù, enyemaka nà nkwàdo site n