Obiano atọọla ntọala ụlọọgwụ nlekọta akọrọ na Nnewi
AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ agbapeela ọrụ iguzòbe ụlọọgwụ ebe a ga na-elekọta akọrọ (kidney) mmadụ na Nnewi, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi North’ nke steeti ahụ. Ya bụ nnukwu ụlọọgwụ bụ nke a na-arụ site n’aka otu onye nnọrọonwe, bụ Dọkịta Okey Chidolue, ma bụrụkwa ebe a ga na-agwọ ma na-elekọta ụdị ọrịa akụrụ dị iche iche, ma ihe gbasaara inyòchà, ịgbanwògharị na itinyegharị akụrụ. N’okwu ya na mmemme ịtọ ntọala iwu ụlọ ahụike ahụ, Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya na mmemme ahụ bụ Kọmishọna na-ahụ maka ahụike na steeti ahụ, bụ Dọkịta Vincent Ọkpala kèlèrè nwa amadi ahụ na-arụ ụlọọgwụ ahụ, bụ Dọkịta Chidolue maka ọmarịcha atụmatụ ahụ, bụ nke o kwuru na ọ ga-enye aka ịgwọ na ibèlata nsogbu ọrịa akụrụ na-emekpa ụmụ mmadụ ahụ n’ụdị dị iche iche, ma na steeti Anambra, ma n’ala Nigeria, ma na mba ụwa n’izùgbe. O kwupụtara obi ụtọ ya banyere etu ndị mmadụ si aña ntị ma na-aza ọkpụkpọ òkù akụ ruo ụlọ ahụ ha na-akpọ ka ụmụafọ steeti ahụ wèlataruo m