Mmadụ iri ekpuola isi ka a gbachara ha ntụtụ n'ụlọọgwụ Kaduna
MMADỤ iri a gbara ọgwụ n’ụlọọgwụ anya na Kaduna e kpuola isi ozugbo a gbachara ha ntụtụ kemgbe ọnwa Mee. Ndị ahụ niile kpuru isi bụ ndị na-abịabu anara ọgwụ n’ụlọọgwụ anya ‘National Eye Centre’ Kaduna. Ozugbo ya bụ ihe mechara, ndị ụlọọlụ na-ahụ maka erimeri na ọgwụ bụ ‘National Agency for Food na Drug Administration and Control’ (NAFDAC) gbatara ozugbo ma were ọgwụ ahụ maka nnyocha. N’ihi mgbagwoju anya maka ya bụ ihe, ndị nlekọta ụlọọgwụ ahụ debere ndị ahụ niile kpuru isi na-enye ha nri na ọgwụ n’efu iji nye aka ka ha hụbakwa ụzọ ọzọ. Ndị ahụ kpuru isi kwuru na o nyeghị ha ọnụ okwu, na ha amaghị ihe mere ha niile ji kpuo isi ụbọchị ahụ a gbachara ha ọgwụ nke sitere n’otu olilo (bottle), ebe ndị nlekọta ụlọọgwụ ahụ kwuru sị na ha na-anwa ike ha iji hụ na ndị ahụ niile bidokwara hụba ụzọ. Onyeisi ndị dibia oyibo n’ụlọọgwụ ahụ bụ Dọkịnta Mahmoud Alhassan kwuru na ụlọọgwụ ahụ dịbu mbụ agba ndị mmadụ ọgwụ ahụ n’enweghị nsogbu ọbụla. O kwuru si: “ọgwụ ọgbụgba ahụ (injection) nke a