Posts

Showing posts with the label ụlọọgwụ Anambra

Gọọmentị Anambra ekeerela ụlọọgwụ ndị ụka nwe N288.5m

N’ỊGA n’ihu n’ọrụ iwulite ngalaba ahụike steeti Anambra, ọchịchị steeti ahụ enyela ụlọọgwụ ndị ụka dịgasị na steeti ahụ mgbàkọta ego ruru nde narị naịra abụọ na iri asatọ na asatọ na ọkara (N288.5m) iji kwàdo ma sị ha jisie ike n’ọrụ ịkwalite ọnọdụ ahụike na steeti ahụ.   Mmemme inyefè ego a bụ nke weere ọnọdụ n’ogige “Dora Akunyili Women Development Centre’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụ nke dọtara ma ndịisi ụka, ndị ọrụ gọọmenti, ndị ndu obodo, ndị ọrụ ahụike, tinyere ndị ọzọ e ji okwu ha agba ìzù na ngalaba dị iche iche.   Dịka o siri metụta nkesà ego ahụ, ụka Katọliiki nwèrè ụlọọgwụ dị iri abụọ na anọ n’ọnụọgụgụ n’ime steeti ahụ, ma nweta akwụkwọ ndọrọ ego dị otu narị nde naịra na iri iteghete na asaa, na ụma narị puku naịra asaa na iri ise.   N’aka nke ọzọ, ụka Angịlịkan nwèrè ụlọọgwụ iri abụọ na isii, ma nwete akwụkwọ ndọrọ ego dị nde naịra iri isii na otu na puku naịra ise; ebe ndị ụka ọgbara ọhụrụ (a maara dịka pentikostaal) nwere otu ụlọọgwụ, ma nwete akwụkwọ n