N'Anambra, ụlọ omeiwu akpọọla òkù ka elenwogharịa njem nlegharị anya
A KỌWAALA mkpa ọ dị ma kpọọ òkù ka e tutee ma lenwògharịangalaba njem nlegharị anya na steeti Anambra, n’ụdị ọ ga-abara gọọmenti steetiahụ na ndị obodo ya úrù. Oku a bụ nke a kpọrọsite n’ọnụ onyeisi oche ótù ọrụ ụlọ omeiwu ahụ na-ahụ maka njem nlegharị anya,bụ Maazị Emma Nwafor, oge ya na ndị òtù ahụ gara kpọtụrụ ụlọọrụ na-ahụ maka ihena-eme na mba ofesi, omenala na njem nlegharị anya, n’isi ụlọọrụ ahụ dị n’Awka. Ndị òtù ahụ n’okwuha dị iche iche, tòrò ọchịchị nọ ugbu a na steeti ahụ maka ezi mbọ ọ gbagoron’inwògharị ngalaba ahụ, ma mee ka a mara na steeti ahụ nwere ọtụtụ ọkpụ na ebenleghaghị anya dị iche iche, bụkwa nke ga-eme steeti ahụ mma n’ụzọ dị iche ichema bulite ọnụ ego a na-enweta n’ime ya, ma ọ bụrụ na e tute, nwògharịchaa matinye ha n’ọrụ etu o siri kwesi. Ha jikwazịrị ohereahụ kpọọ òkù ka e welitekwuo aka n’ego ọrụ a na-amapụtara ụlọọrụ ahụ kwa ahọ ọbụla,iji nyere ha aka ịrụ nnukwu ọrụ ahụ chere ha n’ihu n’ozuzu òkè. Ha kpọkukwara ya bụ ụlọọrụka o welitekwuo aka n’