Posts

Showing posts with the label ụlọ ikpe

Obianọ emegheela ụlọ ikpe mkpegharị ‘Appeal Court’ n'Awka

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ nọrọ ụnyaahụwee gbapee ụlọ ikpe mkpegharị ọhụụ n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, bụkwazị ụlọikpe mkpegharị mbụ a na-eguzobe na steeti ahụ.   N’okwu ya oge ọna-agbape ya bụ ụlọ ikpe, Gọvanọ Obianọ kọwàrà ụbọchị ahụ dịka oke ụbọchị nasteeti ahụ, n’ilegara anya nà mpụtara ya n’ebe o mètụtàrà mgbasàwanye nke ikpenkwụmọtọ, nnwere onwe na ọchịchị onye kwuo uche ya.   O mèrè ka a mara na ọbụ naanị ụlọ ikpe mkpegharị iri na isii ka e nwèbụrụ n’ala Nigeria, wee ruo nanso nso a rụnyèkwùrù anọ n’Awka, Asaba, Kano na Gombe n’otu n’otu, nke mezịrịka ọnụọgụgụ ya dịzie iri abụọ; ọbụnadị dịka ọ gàkwàzịrị n’ihu kọwaa na mgbapeahụ a gbàpèrè nke Awka mèzịrị ka ọ bụrụ ụlọ ikpe mkpegharị nke iri na asatọn’ala Nigeria, n’ihi na a gbapèbèghị abụọ ndị ọzọ.   Ọ kpọpụtàsịrị ọtụtụuru dị iche iche ya bụ ụlọ ikpe ga-ewèta, ma kwuo na ọ ga-aga n’ihu ibèlàtàràndị Anambra na ndị ọrụ ikpe steeti ahụ ntaramahụhụ ịdị na-aga ụlọ ikpe mkpegharịnke dị n’Enugu ịchọ ikpe nkwụ