Na Lagos, Ụka Katọlik enyela fada machiri ukwe Igbo n'ụlọụka ya ocheazụ
ỤKA Katọlik, Achịdayọsis Lagos, enyela ụkọchukwu parish nke Holy Trinity Catholic Church, Ewu-Owa Gerigbe Ikorodu Lagos, Fada James Anelu ocheazụ maka ịmachi egwu Igbo na egwu olu dị iche iche (choruses) na parish ya. Achịbishọp Lagos, Most Rev Dr Alfred Martins, n’ozi nkatọ ‘disclaimer’ nyere ụkọchukwu ahụ iwu ka ọ nyegodu ohere ‘an indefinite leave of absence’. Fada Anelu ka e kwuru na ọ machịrị egwu Igbo na abụ olu dị iche iche na parish ya, ma kwuo na a ga-egbochilata otu ‘Ndigbo’ si awa anya. A chọpụtara na o ji iwe kwụsị ukwe/abụ na-akpalite mmụọ oge a na-enye onyinye nke ugboro abụọ, ma kwuo na ndị Igbo agaghị anọgide n’ịwakpo ndị ọzọ anya na parish ya. E kwukwara na ụkọchukwu ahụ gara n’ihu rụtụ aka na dayọsis Benin, ebe ndị Igbo wagidere anya wee ruo na nke ịbụ bishọp. Otu o sila dị, o kwuru na mmụọ nke Chineke maara sọọsọ asụsụ ndị gbara parish ahụ gburugburu. Dịka ọ na-ekwuputa ozi inye ocheazụ ahụ, Achịbishọp Martins na leta o dere na Febụwarị 7, kwuru sị: “Ozi