N'Awka, ndị ACORA ejirila ọṅụ kàá ụka ọmụ
ỤLỌỤKA ‘Anglican Church of Redemption Parish, Awka’ dị na steeti Anambra juru kpụmkpụm n’ọnụ ụbọchị ụka, dịka ya bụ ụlọụka sonyere ibe ya na mba ụwa, wee merùbe mmemme ụka ọmụ nke ahọ 2022. Ya bụ ụka oriri nsọ nke onyeisi nchụaja n’ụlọụka ahụ, bụ Ven. Obiorah Alokwu nọ n’isi ya, bụ nke jupụtara n’ebube, dịka ndị bịara ụka n’ebe ahụ jiri obi ụtọ na ọmụ/igu nkwụ ha wee pụọ ma jiri egwu na abụ otuto dị icheiche wee gagharịa n’ụfọdụ okporoụzọ n’Awka, dịka e si eme ya n’ụlọụka dị icheiche. N’okwuchukwu ya n’òfùfè nrò ahụ, nke isiokwu ya bụ ‘Ịmụta Ihe Site n’Aka Kraịst Jizọs’ (Learning from Christ Jesus), Ụkọchukwu Lucky Onebunne kpọkùrù ndị ụka ka ha ñomie akparamagwa Kraịst, ma sokwa nzọụkwụ ya n’ozuzuoke. Ọ gbadoro ụkwụ n’Akwụkwọ Ndị Filipaị, isi nke abụọ, malite n’amokwu nke ise, wee ruo na nke iri na otu, wee kọwaa na otu n’ime ihe pụtakarịchara ihe na ndụ Kraịst bụ na o wedara onwe Ya n’ala dịka ezi onye njeozi, n’agbanyeghị ogoogo Ya; o wee nagide ma gabiga akaje na ihe dị ichei