E meela nchèta ụbọchị nwere onwe Nigeria n'Awka
DỊKA ala Nigeria mere mmemme icheta na o nwerela onwe ya, ya bụ oke mmemme bụ nnọọ nke kporo ọkụ ma gakwa siriri werere n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra. Nnukwu mmemme ahụ bụkwa nke a nọrọ na ya wee mee ncheta ọgbụgba ahọ iri ise na asatọ nke ala Nigeria, ma bụrụkwa nke dọtara ndị dị iche iche e ji okwu ha agba ìzù na steeti ahụ na mpụga ya, nke gụnyere ndị ọchịchị, ndị ụlọ ọgbakọ omebe iwu, ndị isi ụka, ndị eze ọdịnala, ụmụ akwụkwọ, tinyere ndị ọrụ uwe dị iche iche n’ala anyị. N’okwu ya na mmemme ahụ, bụ nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme, aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kọwara mmemme ahụ dịka oge kwesiri iji tụgharịa uche n’ọnọdụ ala Nigeria, ihe dị iche iche na-eme n’ime ya oge ugbu a na nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme n’ala anyị n’ahọ 2019. O mere ka a mara na ala Nigeria agabigala ọtụtụ ihe, ma ka na-agabigakwa ruo ugbu a, ma sị na ụfọdụ ihe ndị ahụ bụkwa nnọọ nke ụfọdụ mbà ndị ọzọ dị iche iche gabìgàgòrò, ọ bụnadị dịka o kwuputara ezi olile anya o nwere na