Posts

Showing posts with the label ụbọchị ndị anyarị

E meela ụbọchị ndị anyarị n'Anambra

…Kpọọ gọọmenti oku nkwàdó A KPỌKUOLA gọọmenti s n’ogoogo dị icheiche ka ha nyere ndị anyarị aka n’ihe dị icheiche ha na-agabiga, ya na iji hụ na mbọ dị icheiche ha na-agba iji gbochie ọrịa kansa ime ha mị̀tàrà mkpụrụ a tụrụ anya.   Onyeisioche òtù ahụ jikọtara ndị ọrụsị na steeti Anambra, bụ Ọkaiwu Chuks Ezewuzie bụ ya kpọrọ oku a n’okwu ya na mmemme imerube Ụbọchị Ndị Anyarị na Mba Ụwa, nke ahọ 2022, bụkwa nke weere ọnọdụ n’ogige ‘Dora Akunyili Women Development Centre’ dị n’Awka, bụ isi obodo steeti Anambra.   N’okwu ya na mmemme ahụ, nke isiokwu ya bụ ‘Ijikọta Aka Iji Mee Ka A Nụ Onu Anyị’, Ọkaiwu Ezewuzie gbarụrụ ihu banyere etu ụfọdụ gọọmenti n’ebe dị icheiche si eleghara ndị anyarị anya, ya na ihe dị icheiche ha na-agabiga; ma kpọọ òkù ka e belata nke ahụ, maka na ndị anyarị bụkwa mmadụ Chukwu kere eke n’ụdị nke ha ka ha bụ.   Ọ gwara ọtụtụ ndị anyarị bịara mmemme ahụ ka ha ghara imechi ọnụ ha maọbụ gba nkịtị, kama ka ha mee ka ụwa nụ olu ha, iji mee ka e nwee mgbanwe n’etu ndị m