Ụmụnwaanyị Igbo akpọọla oku, rịọ ka a kwụsị ịkwafu ọbara n'ala anyị
N’IHI oke ịghafu ọbara na ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị n’ala anyị ugbu a, otu ndị okenye ụmụnwaanyị n’ala Igbo akpọọla oku ka obodo jụrụ oyi, ka ibu agha na igbu mmadụ dere duu ka udo tọrọ atọ dị, ma na mpaghara ‘Southeast’ na n’ala Nigeria niile gbaa gburugburu. Òtù ahụ, bụ nke bụ ngalaba (apex) Ọhaneze Ndigbo ji ohere ahụ katọọ ogbugbu e gburu ndị mmadu n’Awukuzu dị n’okpuru ọchịchị Oyi na steeti Anambra; nke ndị amaghị ndị ha bụ gburu; tinyekwara ọtụtụ ọnọdụ enweghị ezi nchekwa dị n’akụkụ ala Igbo dị iche iche n’ala Igbo tinyere ala Nigeria niile. N’okwu ya na mmemme ahụ, onye hibere Centre for Psychic and Healing Administration, Dọkịnta (Oriakụ) Flora Ifeanyichukwu Ilonzo (Anyafulugo) kwuputara na igbu mmadụ na ọnọdụ enweghị ezi nchekwa nke a na-ahụtakarị n’oge mbụ na mgbago ugwu (North) agazuola ala anyị niile ugbu a. Ọ kọwara na ya dị na mbụ hụta ma bido na-adọ aka na ntị, na-eti mkpu banyere otu ọnọdụ enweghị ezi nchekwa si arị elu n’ike n’ike na ihe ọjọọ si na ya apụta. D