Posts

Showing posts with the label Ụmụada Igbo

Ụmụada Igbo na-eburịrị agha megide ịdakpo nwaanyị n'ike

DỊKA ịdakpo nwaanyị kwaa ya iko n’ike na-arị elu n’ike n’iken’ala anyị, otu jikọtara ụmụada Igbo, nke e ji Ụmụada Igbo Nigeria and Diasporawee mara na-aga n’ihu na-akatọ arụ ahụ ma na-akpọ oku ka a mara ihe e mere yatupu mmiri aṅaa garị.   Ka anyị cheta na ndịWomen Aid Collective (WACOL), na-agbachitere ụmụnwaanyị kwuru na ha nwetaramkpesa ruru otu narị na iri ise na atọ n’agbata ọnwa Juunu na Julaị n’afọ abanyere ndakpo na mmegide dị iche iche n’ebe ụmụnwaanyị nọ; otu ụmụada Igbon’ihi nke ahụ kwudosiri ike na-eti mkpu ka gọọmenti leruo anya nke ọma na ya bụnsogbu.   Onyeisi zuzugbe otuahụ ma bụrụkwa onye hibere ya, Oriakụ Kate Ezeofor kwuru na otu ahụ ga-agan’ihu n’ibuso agha megide ịdakpo nwaanyị n’ike. Ọ kpọrọ oku ka gọọmentina-agbasi mbọ ike iji hụ na a na-echekwaba ụmụnwaanyị n’ihi na ọtụtụ ndị  a dakporo, kwaa ha iko n’ike na-anọgide n’iruuru ya ndụ ha niile.   O kwuru sị: “Ana m akpọku gọọmenti etiti na nke steeti ka ha mara ihe ha nwere ike ime iji belata nsogbu  ndakpo. Ọ na-e