Posts

Showing posts with the label Ụlọelụ

Ụlọelụ okpukpu iri na abụọ adaala n’America

OPEKATA mpe, mmadụ anọ anwụọla, ebe otu narị na iri ise na iteghete na-efu efu n’ihi ọdịda ụlọelu okpukpu iri na abụọ dara na Miami nke dị na United States of America. A na-akọwa na o doghị anya mmadụ ole nọ n’ụlọ ahụ oge ọ dara.   Njinji ahụ jiri ka o jiri ọkara gafee elekere mbụ nke ụtụtụ (dịka oge America siri dị). Ulọ ahụ ka e kwuru nọ ọ dịla afọ iri anọ e jiru rụ ya.   Onye ọchichi, Mayor nke Miami-Dade, Daniella Levine Cave kwuputara na ndị ọrụ ihe ntumadị (emergency agencies) ka nwere olile anya na a ga-enweta ndi anwụghị anwụ. Ndi orụ nzopụta e zigara ebe ahụ kọwara na ha nụrụ olu ndị mmadụ na-eme mkpọtụ n’ime ikpo ụlọ ahụ dara ada.   Otu o sila dị, a kọwaala  maka mmadụ dị otu narị na abụọ, ma o dochaghị anya mmadu ole nọ n’ime ụlọ ahụ oge ọ dara. A bọpụtala ọtụtụ ndị mmadu n’ikpo ụlọelụ ahụ dara ada.   Onyeisiala Joe Biden nyere ntụziaka ka Federal Emergency Management Agency (FEMA) sonye n’ọrụ izọ ndụ ahụ.    Dịka e siri kwu, nari kwuru narị ndị na azọ ndị mmadụ n’ikpo ụlọ a