Ụlọakwụkwọ FJMHS Aguleri agbaala ahọ iri isii
O KWÒRÒ ekwò ma hịọ ahịọ na nsonso a dịka ụlọakwụkwọ ‘Father Joseph Memorial High School, Aguleri’ dị n’okpuru ọchịchị ‘Anambra East’ merùbèrè mmemme ọgbụgba ahọ iri isii o jiri malite. Mmemme ahụ bụ nke e jiri ofufe nro pụrụ iche wee malite, ma bụrụkwa nke dọtara ndị nkuzi na ndị dị gụrụ akwụkwọ na ya bụ ụlọakwụkwọ malite na mgbe o jiri malite wee ruo taa. N’okwuchukwu ya n’ebe ahụ, Achbishọọpụ nke mpaghara Ọnịcha, bụ ‘Most Reverend’ Valerian Okeke kelere Chineke maka ya bụ ụlọakwụkwọ, bụ nke zụpụtàgòrò ọtụtụ ndị mmadụ e ji okwu ha agba izu na ngalaba dị iche iche na mpaghara ebe dị iche iche na mba ụwa ugbua, ma ka na-emekwa nke ọma, na-agawanyekwa n’ihu ruo taa. O mere ka a mara mkpá ọ dị ụlọaka na gọọmentị ịga n’ihu ijikọ aka ọnụ n’ịkwàlite ọganihu obodo ọbụla, ọkachasị dịka o siri metụta agụmakwụkwọ na mmụta. O tòkwàrà ọchịchị nọ ugbua na steeti Anambra nakwa ọchịchị ndị ọzọ gara aga, tinyere ndị mmadụ na otu dị iche iche tụnyegoro ụtụ n’ụzọ dị iche iche n’ịkwàdò na n’ịkwàli