Nri ndị Igbo: Ụkwa na ọka
NRI ụkwa bu nri onye Igbo ọ bula na-enwe mmasị na ya. Ụkwa na-atọ ụtọ, ọ na-enye ihe n’ahu. N’ihi ụtọ ụkwa na-atọ, ebe ọ bụla e mere mmemme sie ụkwa, onye ọ bụla biara ebe ahu ga-achọ iri ụkwa. Otu ọ bụla i siri sie ụkwa, ọ na-atọ ụtọ. N’izu a, anyi ga-esi ụkwa na ọka. Otu a ka e si e si ma na akwado ụkwa na ọka. Ọ bụrụ na ụnụ dị mmadụ iri n’ ụlọ, ego adighi, mana ụnụ chọrọ iri ụkwa, Ị mata iko ọka ise, i mata iko ụkwa iri, buru ụzọ sie ha abụọ ka ha gheere onwe ha, ka I wee nụ ụtọ ya. Ụkwa ghee, ọ bụrụ na I choghi ińu mmiri ya, I sitaa ya mmiri gbanya mmanụ n’ite, ọ di obere ọkụ, wunye yabaasi, ịra, ose na nnu, o ghee, wụnye ọka na ụkwa ahụ, gwọkọọ ya nke ọma, lee ma nnu ọ dikwa ya, ọ bụrụ na nnu tụrụ ya, I kebezie ụkwa na ọka gị. N’ezie, ụkwa na ọka bụ ọtọ n’ubụrụ isi.