Posts

Showing posts with the label Ụkpọ ogede

Nri ndị Igbo: Ụkpọ ogede

NdỊ Igbo nwere ọtụtụ ihe oriri mara mma ma nsogbu e nweren’oge a bụ nganga na ngana. Ụfọdụ chechaa otu ha ga-esi kwado nri ndị a ana-ekwu maka ya, ha agaa goro nri a na-ere n’akụkụ ụzọ. Ma onye ọ bụla dị uchuga na-agba mbọ ka o jiri aka ya siere ezinaụlọ ya ihe oriri ndị a na-ekwu makaha.   Ọ dị mkpa na onyeIgbo ọbụla ga na-esi nri ndị Igbo o pekata mpe ugboro abụọ n’izuụka.   Na nke taa, anyịga-eleba anya n’otu e si esi nakwa ka e si akwado ụkpọ ogede. Ụzọ ihe abụọ ka eji esi ụkpọ ogede. Nke mbụ, ị weta ọka a kwọrọ akwọ (corn flour), ị wụnye yan’ihe ị ga-eji gwọkọ ya, ị gbanye mmanụ n’ọka ahụ ị gwọkọba ya na mmanụ ahụ nkeọma, i weta ojoko chara acha, i wepụ azụ ya wụnye ya n’ikwe kwọrie ya nke ọma, ịkọrọ ya tinye n’ime ọka ahụ ị gwọkọrọ malite gwọkọọ ha abụọ ọnụ. Mgbe ha abụọ bụụrụ otu, i tinye nnu, ose,yabasii, ịra, ị malite gwọkọchaa ya, ị gbanye mmiri dị ńara ńara.   Cheta na mmiri agaghịakarị ya ka o wee kwe nkechi. I weta akwụkwọ unere ị ńara n’ọkụ, i dozichaa yamalite na-akọnye